Take a fresh look at your lifestyle.

Mkpa dị n’ịnabata nwunye ọhụrụ n’ala Igbo

0 585

N’ụfọdụ ebe n’ala Igbo, a na-anabata nwunye ọhụrụ n’ụzọ pụrụiche.

Tupu a lụọ nwaanyị na ọwụwa anyanwụ Naịjirịa, e nwere ihe dị iche iche a na-eme, nke gụnyere:

Ịjụ ese: Ọ bụghị naanị ndị chọrọ ịlụ onwe ha ga-ekwekọrịta ịlụ, ndị be nwoke na nke nwaanyị ga-ekwetakwa ma ụmụ ha a ga-alụ onwe ha. Ọ bụkwa n’oge a ka a ga-eleba anya ebe nwoke na nwaanyị ahụ si, marakwa na ndị be ha a bụ ezigbo mmadụ, na o nwere etu ọbụla ha siri bụ nwanne. Maka n’ala Igbo, nwanne na nwanne anaghị alụ onwe ha, ọ bụ arụ.

Ụgwọ isi nwaanyị: N’ụfọdụ ebe, ego a na-akwụ n’isi nwaanyị dị oke ọnụ ahịa, mana n’ụfọdụ ebe, ọ dịghị etu ahụ. Mana a na-akwụ ụgwọ n’isi nwaanyị maka etu be ndị nke nwaanyị siri zụlite ya ka ọ bụrụ ezigbo mmadụ dị mma ịlụ alụ.

Ihe ndị ọzọ bụ: ịgba nkwụ, idu ụlọ, ịmata ụlọ di, dgz

Mana ihe ọzọ dị mkpa anaghị ekwuta maka ya bụ etu e si anabata nwunye ọhụrụ ahụ na be di ya ọhụrụ.

Ọkammụta Chigozie Nnabuihe (Department of Linguistics, African and Asian Studies n’University of Lagos) kwuru na ịnabata nwunye ọhụrụ bụ omenaala, ọbụghị nso ala.

Kedụ etu e si anabata nwunye ọhụrụ?

Ọkammụta Nnabuihe kwuru sị na mgbe elu bụ ala ọsa, n’ebe ụfọdụ, ọ na-abụ na alụbata nwaanyị ohụrụ, ndị nne, ndị alụbatara n’ezi ahụ, na ụmụagbọghọ na-agbakọ anabata nwaanyị a lụrụ ọhụrụ.

Oge ahụ bụ oge a na-atụ anya na nwaanyị na-abịa na di amabeghi nwoke. Ka di na nwunye na-abanye n’ọnụ ụlọ, a na-akwawara ha akwa ọcha.

Ha hichaa ụra, chi foo, ha ga lee akwa ọcha ahụ, ha hụ ọbara na ya, ha amara na ha nwetara ebele na-awaghi awa, na-akpoghi aziri.

Mgbe ahụ ka egwu ọtịtọ ịtọ nwaanyị ahụ ga-amalite. A na-ezighachiri ndị mụrụ nwaanyị ahụ ozi ito ha maka ịzụpụta ya. A na-akpọ ya ‘nwaanyị di bịakwutere n’ụlọ’.

Ọ bụrụ na ọ dịghị etu ahụ, ha zigaa ozi mkparị na nleda anya n’ihi ha enweghi ike ijide maọbụ zụlite nwa ha n’ụzọ kwesịrị.

N’ọtụtụ ebe n’ala Igbo, ndị na-abịa eso bee akwa e ji edụla nwa agbọghọ na di bụ ụmụagbọghọ ibe ya ndị so ya too n’ebe a mụrụ ya.

Ọ bụ ha na-agụ egwu duru ya laa be di ya.

Mana ọ bụrụ na o nwere ndị nke ha bụ ụmụagbọghọ maọbụ ụmụọkpụ a mụrụ n’ezi ahụ bụ ndị ga-abịa nabata ya, nke bụ eziokwu bụ na ọ dị mkpa na a nabatara ya, ka ọ mara na ọlụlụ ka a lụrụ ya, ọ bụghị ntụtụta ka atụtụtara ya.

Ihe mere o jiri dị mkpaIhe mere ịnabata nwunye ọhụrụ jiri dị mkpa bụ ịgosi na a lụrụ ya, ọ bụghị nzụta ka azụtara ya.

Oge ahụ ka a na-egosi nwaanyị ụlọ ọhụrụ ya, ma gosi ya na a nabatara ya. O nwere ike isi ebe ahụ mara nwunye di ya ndị ọzọ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *