Take a fresh look at your lifestyle.

Ọkụ Agbaala Ngalaba Ụlọikpe Kasị Elu

Salihu Ali dere ya na bekee

0 401

Otu akụkụ nke Ụlọikpe Kasị Elu nke Naịjiriya agbaala ọkụ n’ụtụtụ Mọnde.

Ọkụ ọgbụgba a, dịka ụfọdụ ndị hụrụ ka ọ si mee si kwuo, malitere n’ihe dịka elekere asatọ nke ụtụtụ na Ụlọikpe Ndị Ọkaikpe, site na Chamber nke ise nke Ọkaikpe Mohammed Saulawa nọ n’okpukpu nke anọ nke akụkụ Ụlọikpe Kasị Elu.

Ụlọ ọrụ abụọ ọzọ, ka ekwuru na ọkụ a gbakwara.

Site na ebe ahụ, Voice of Nigeria na-akọ na ọkụ ahụ mebiri akwụkwọ ndị bara uru na arịa ụlọ ọrụ dị n’ụlọ ọrụ dị n’okpukpu nke anọ nke Ụlọikpe ndị Ọkaikpe.

Ozi izizi na-egosi n’ọbụ ọkụ eletrik kpatara ya.

N’oge a na-ede akwụkwọ akụkọ a, ngalaba Ụlọikpe Kasị Elu nke Ụlọikpe Kasị Elu jisiri ike gbanyụọ ọkụ ahụ, ndị ọrụ nchekwa na-etinyekwa aka n’ọrụ iji weghachi iwu.

Ka ọ dị ugbu a, onye na-ahụ maka mmekọrịta ọha na eze maka ụlọikpe ahụ, Maazị Festus Akande, azaghị oku dịka n’oge a na-ezipụ akụkọ a.

 

 

 

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *