Take a fresh look at your lifestyle.

Ndị Agha Napụtara Mmadụ Iri Abụọ Na Ise N’aka Boko Haram

Nokai Origin dere ya na bekee

0 338

Ndị agha nke 144 Battalion enweela ihe ịga nke ọma napụta ndị mmadụ iri abụọ na ise n’aka ndị na-eyi ọha egwu Boko Haram ji na Borno Steeti, North East Nigeria.

Nke a dị n’akwụkwọ ozi onyeisi ndị agha na-ahụ maka mmekọrịta ọha na eze bụ Brigadier General Onyema Nwachukwu wepụtara, kwuru na ọ bụ na mbọ ndị agha na-agbasi mbọ ike ikpochapụ ndị Boko Haram Terrorists (BHT) fọdụrụ na Borno na steeti ndị gbara ya gburugburu.

Ndị agha galant na njikọ Hybrid Force, chụpụrụ mmadụ iri na anọ n’ime ọrụ mkpochapụ na obodo Gobara dị na Gwoza Local Government Area nke Borno steeti na Satọde 26 Ọgọst 2023. Ndị a gbapụtara gụnyere ụmụ nwanyị isii na ụmụaka asatọ.

N’ime ọrụ yiri nke ahụ na Sọnde abalị iri abụọ na asaa ọnwa Ọgọst 2023, ndị agha 82 Task Force Battalion na njikọ Hybrid Force, wakporo BHT na mpaghara ógbè Gava dị na kansụl ime obodo Gwoza nke Borno Steeti wee napụta ndị nkịtị iri na otu. Ndị niile a gbapụtara agbapụta nọ ugbu a n’aka ndị agha na-eme profaịlụ.

N’ime ọrụ dị iche n’abalị iri abụọ na asaa ọnwa Ọgọst 2023, mmadụ asaa nke otu ezinụlọ BHT nyefere n’aka ndị agha nke 81 Division Task Force Battalion na na kansụl ime obodo Dikwa nke Borno Steeti. Ezinụlọ ahụ nwere ndị okenye atọ na ụmụaka anọ.

N’ime ọrụ mgbochi ndị ohi n’ abalị iri abụọ na asaa ọnwa Ọgọstụ 2023 na Kaduna Steeti, ndị agha 2 Battalion, Nigeria Army, na-eme ihe gbasara ozi memilara otu onye omekome ma tọhapụ mmadụ anọ a tọọrọ n’ogbe Kwana Shehu dị na mpaghara kansụl ime obodo Birnin Gwari nke Kaduna Steeti. Ndị ahụ a gbapụtara agbapụtara bụ ndị e jikọtara ha na ndị ezinụlọ ha ọnụ kemgbe.

Ndị agha Naijiria na-akpọku ndị ọha na eze ka ha kwado ndị agha ahụ na ozi ziri ezi iji kwalite ọrụ na-aga n’ihu n’ofe mba ahụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *