Take a fresh look at your lifestyle.

Buhari Ekwuputala Na Ya Enyeghị Ndị Otu Ọrụ Ya ‘Soft Landing’

Timothy Choji dere ya na bekee

0 322

Onye chịburu Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari akọtọla akụkọ n’akụkụ ụfọdụ na ya arịọla onyeisiala bụ Bola Tinubu ka ọ ghara inyocha ndị bụbu ndị ọchịchị.

N’ozi Garba Shehu, ọnụ na-ekwuru onye isi ala Buhari, wepụtara, onye bụbu onyeisiala kwuru na akụkọ ndị dị otú ahụ bụ adịgboroja.

“Ọ bụrụ na a ga-ekwere na mgbasa ozi soshal midia, onye bụbu onyeisiala Muhammadu Buhari na-arịọ onye ga-anọchi anya ya bụ Bola Ahmed Tinubu ka ọ ghara inyocha ụfọdụ ndị isi ọchịchị ya mbụ.

“Ọ bụ adịgboroja, ka anyị ghara ikwurịta ya ma ọ bụ nye ya ume ma ọ bụ ikuku mgbasa ozi. Nke a bụ akụkọ adịgboroja, ọ nweghịkwa ihe ọzọ.

“Ekele dịrị, ọ dịghị onye ọzọ ma e wezụga ndị isi abụọ n’ime ụlọ ha zutere, yabụ na ọ dịghị onye nọ ebe ahụ ịkọ mkparịta ụka ha,” o kwuru.

Garba Shehu kwuputara na onye bụbu onyeisiala agaghị etinye aka na ọchịchị obodo ugbu a bụ Bola Tinubu nọchiri anya ya.

“Dị ka o kwere mee, Onye isi ala mbụ chọrọ ka ọ nọrọ n’èzí ka ọ ghara ịdọpụ uche nchịkwa ọhụrụ ahụ.

“Ọ họọrọ ịla na Daura na-atụ anya ịchọta ụdị jụụ ọ chọrọ maka onwe ya mana ọ ghọtara na ọ bụghị otú ahụ, ndị ọbịa na-agbakọta n’ụtụtụ, ehihie na abalị, ọ kwagara n’ebe dị anya karị.

Ọ gbakwụnyere, “Ọ ka bụ ọchịchọ ya ka a hapụ ya ka ọ nweta ezumike ọ chọrọ, na ka ndị ọchịchị Tinubu nwee ọnọdụ kwesịrị ekwesị iji rụọ ọrụ na mmezu nke nkwa ha kwere,”  ọ gbakwụnyere.

 

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *