Take a fresh look at your lifestyle.

Folashodun Shonubi: Onye ga-anọchi Emefiele dịka onyeisi ụlọakụ etiti nke nchereoge

0 302

Ụlọakụ Etiti nke Naịjirịa enwetala onyeisi ọhụrụ nke nchereoge dịka Onyeisiala Bola Tinu chụpụrụ Godwin Emefiele.

Aha onyeisi ọhụrụ a bụ Folashodun Adebisi Shonubi, onye jibu ọkwa ‘Deputy Governor (Operations Directorate) n’ụlọakụ etiti.

A họpụtara Shonubi dịka osote gọvanọ n’ụlọakụ etiti n’ọnwa Ọktoba afọ 2018.

Lee ụfọdụ ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ maka ndụ Folashodun Adebisi Shonubi:

  • A mụrụ ya n’ụbochị asaa nke ọnwa Maachị afọ 1962
  • Ọ bụ onye Ogun Steeti
  • Ọ gụrụ akwụkwọ Sekọndịrị na ụlọakwụkwọ ‘Government College’ nke Ibadan
  • Ọ gụrụ akwụkwọ dị elu na Mahadum Legọs, malite n’afọ 1978 ruo 1983
  • O nwere ọzụzụ na ngalaba ‘Mechanical Engineering’, mana n’etiti afọ 1988 ruo 1989 ọ gbanwere ngalaba ọzụzụ ya gafee na ngalaba ego dịka o nwetara nzere ‘Masters’ na ‘Business Administration’
  • Ọ malitere ọrụ n’ụlọakụ Citibank n’afọ 1990
  • O sonyeere ụlọakụ etiti dịka osote gọvanọ n’afọ 2018
  • O sokwa na ndị isi na ngalaba gọọmentị na-anakọ ụtụisi a kpọrọ ‘Federal Inland Revenue Service’ (FIRS) ebe ọ na-anọchite anya onyeisi ụlọakụ etiti

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *