Take a fresh look at your lifestyle.

Ihe Gọvanọ Peter Mbah gwara Onyeisiala Tinubu maka ntọhapụ Nnamdi Kanu

0 282

Gọvanọ Peter Mbah nke Enugu steeti ezigarala Onyeisiala ọhụrụ Naịjirịa bụ Bola Tinubu ozi banyere ntọhapụ onye ndu otu Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Nnamdi Kanu ma rịọ ya ka o tinyesie anya ike n’atụmatụ nhọhapụ ya n’ihi na ọ ga-abụ iwepụta aka udo nye ndị Ọwụwa Anyanwụ Naijirịa.

Dịka o zutechara onyeisiala Naịjirịa, o gwara ndị ntaakụkọ obi gọọmentị okwu na Tọọzde abalị asatọ nke Juun, 2023 kwuo:

“Anyị kpakwara maka ntọhapụ Nnamdi Kanu. Ị ma na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naijirịa ejịkọla aka ọnụ na-achọ ka a tọhapụ Nnamdi Kanu.”

“Anyị na-arịọ ka onyeisiala nke a bụ onye ụbọchị e duru ya iyi n’ọrụ kwere nkwa na o ga-akwalite ọgwụgwọ ma jiri ọmiiko chịa”

Mbah kwukwara sị: “Anyị na onyeisiala kpara nke a. Anyị amasiela ọkwa ike, anyị amachiela iwu nọrọ n’ụlọ kwa ụbọchị Mọnde n’Enugu. Nke a pụtara na anyị ga-achọ ka a kwalite nchekwa iji buso ihe aka mgbe ga-eso nke a agha.”

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *