Take a fresh look at your lifestyle.

Onyeisiala Tinubu Ezutela Ndị Isi Ọrụ Nchekwa

Timothy Choji dere ya na bekee

0 379

Onyeisiala Bola Tinubu na-enwe nzukọ ugbu a na ndị isi ọrụ nchekwa Naijiria, nke onye isi ndị ọrụ nchekwa, General Lucky Irabor, na-edu na Presidential Villa, Abuja.

Onye isi ndị ọrụ nchekwa duru ndị isi ọrụ na ndị isi nke ụlọ ọrụ nchekwa ndị ọzọ banye n’oche ọchịchị n’ihe dị ka elekere 10:30 GMT maka nzukọ nchekwa.

Ndị bịara nzukọ a gụnyere onye isi ndị agha, Lt. Gen. Farouk Yahaya; Onye isi ndị agha mmiri, Vice Admiral Awwal Gambo; Onye isi ndị ọrụ ụgbọ elu, Air Marshal Isiaka Amao na Inspector-General nke ndị uwe ojii, Usman Alkali Baba.

Ndị ọzọ bụ Director-General nke Department of State Service (DSS), Yusuf Bichi; Onye isi oche nke National Intelligence Agency (NIA), Ahmed Rufai Abubakar.

Nzukọ a na-aga n’ihu bụ mkparịta ụka mbụ Onye isi ala Tinubu na ndị isi ụlọ ọrụ nchekwa na ọgụgụ isi obodo kemgbe ọ malitere ọrụ na Mọnde, Mee 29.

Onye isi ala ahụ zutere onyeisi oche nke Economic and Financial Crimes Commission (EFCC), Abdulrasheed Bawa, na Villa na Wednesde.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *