Take a fresh look at your lifestyle.

Onyeisiala Tinubu Emeela Mpụta Izizi N’ụlọ Ọrụ.

Timothy Choji dere ya na bekee

0 309

Onye isi ala Bola Tinubu ebidola ọrụ dị ka onye ndu Naijiria.

Ọ pụtara na mbụ ya n’ụlọ ọrụ na Tuzdee mgbe elekere na-akụ 13:31 GMT.

Nke a na-esote ịṅụ iyi ọrụ ya dị ka onye isi ala nke Repọblik nke Naijiria n’ụbọchị Mọnde abalị iri abụọ na itoolu ọnwa Mee.

Igwe ụgbọ ala (convoy) Onyeisiala batara n’ime Presidential Villa n’ehihie Tuzdee ebe Osote onyeisiala Kashim Shettima nabatara ya, onye n’onwe ya maliteghachiri ọrụ n’isi ụtụtụ.

Ndị ọzọ bịakwara nabata Onyeisiala bụ Ọkà Okwu, Ụlọ Ndị Nnọchiteanya, Femi Gbajabiamila na Permanent Secretary State House, Tijjani Umar, na ndị ọzọ.

Onye isi ala ozugbo wee banye nzukọ mechiri doro ụzọ, ya na Gọvanọ Central Bank of Nigeria, Godwin Emefiele, Onye isi ndị otu, Nigerian National Petroleum Company Limited, Mele Kyari.

 

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *