Take a fresh look at your lifestyle.

Ihe ndị  dị n’ụlọ nwere ike ibutere ezinaụlọ nsogbu ahụike

0 885

Dịka Dkta Okon Akiba kọwara ya, ‘domestic hazards’ bụ “ihe ọbụla nwereike imerụ mmadụ ahụ n’ụlọ”.

Lee ụfọdụ n’ime ha nakwa ihe ndị dọkịta ọkachamara n’ihe gbasara nchekwa gburugburu na ụlọọrụ nke Bekee kpọrọ ‘Occupational and Environmental Physicians’, kọwara maka ha, nakwa etu i nwereike isi gbalahu ọghọm ha nwereike ibute:

1. Kamfọ

Kamfọ bụ nzu Bekee ụfọdụ ndị mmadụ na-etinye n’igbe akwa ha maọbụ n’akụkụ ụlọ iji chụọ ụchịcha na ahụhụ ndị ọzọ ọsọ, nakwa ime ka akwa ha maọbụ ụlọ ha na-esi isi ọma.

E ji ya arụ ọgwụ ụfọdụ, ọkachasị nke a na-ete n’obi maka oyi na ọtịta ahụhụ.

Mana Dkta Abdulhakeem Abiola dọrọ aka na ntị kwuo na o nwere ike ibute ịba ọchananya.

Aha nkeananụānụ,

Ọdachi i kwesịrị izere ma ị na-arụ ụlọ gị- Ọkachamara

O nyere ndụmọdụ sị “Ọ ka mma ka ndị mmadụ na-agba ọgwụ n’ụlọ ha na gburugburu (fumigation) mgbe ọbụla”.

Ndị ọkachamara ahụike na websait WebMed kwuru na kamfọ nwere ike ibute ihe ọdịdọ, ọrịa imeju (liver disease) maọbụ ọnwụ ma mmadụ loo ya n’amaghị ama maọbụ o si n’akpụkpọ ahụ banye mmadụ ahụ.

N’otu aka ahụ, Dkta Joseph Akinde bụ dịbia ahụike ụmụnwaanyị kọwara na kamfọ nwere ike ibute nsogbu na nwaanyị dị ime nakwa nke na-enye nwa ara.

O nwere ike ime nwaanyị dị ime ọ mụọ nwa kga-eji nsogbu ahụike pụta ụwa.

2. Ọdọmmiri Ogwugwu

Ụfọdụ ndị ọgaranya na-arụ ọdọmmiri ogwugwu nke Bekee kpọrọ ‘swimming pool’ n’ụlọ ha iji na-enyere ndụ aka.

Mana a kpachaghị anya, ya bụ ihe e ji ekpori ndụ nwere ike ibute ọnwụ.

Dịka Dkt Abiola siri kọwaa, ọdachi ahụike nwere ike isi na nke a pụta bụ mmiri iri mmadụ maọbụ mmadụ ibute ọrịa na-efe efe.

N’afọ 2018, nwa nwoke Daniel Oyebanjo bụ otiegwu Naijiria a ma ama dịka D’Banj, nwụrụ dịka ọ dakpuru n’ọdọmmiri ogwugwu ha nwere n’ụlọ ha.

Dkta Okon Atiba nyere ndụmọdụ sị, “Okenye amaghị egwu mmiri egwula mmiri naanị ya.”

“Ka onye nwere ọrịa na-efe efe, onye mmanya na-egbu, onye akwụkwụ maọbụ ihe ọdịdọ na-adọ (belusọ ọ gbakeela), ghara igwu mmiri.”

Dkta Abiola sị na ọ dị mkpa onye na-azọ ndụ bụ ‘Life guard’ na Bekee ịnọ nso n’ọdọmmiri ogwugwu oge ọbụla onye amaghị egwu mmiri na-egwu mmiri.

O kwukwara na ọ dị mkpa inwe ‘life jacket’ nso odommiri maka ndị amaghị egwu mmiri.

3. Ọgwụ

Ọgwụ, ma nke mkpụrụ, ma nke mmiri nwere ike ibute ihe ndapụta ga-eduga mmadụ n’ụlọọgwụ maọbụ n’ala ili.

Nke a ga-eme ma ọ bụrụ na mmadụ ṅụfee ole dọkịta gwara ya ṅụọ, maọbụ mmadụ ṅụọ ọgwụ mebigoro emebi.

Kpachapụ anya, ma debe ọgwụ ebe aka nwata agaghị eru ya.

Tufuo ọgwụ ọbụla oge ya gafegoro ka mmadụ ghara ịṅụ ya na-amaghị ama.

4. Batịrị

Ihe ọzọ a na-ahụ n’ụlọ nwere ike ibute ihe mberede bụ batịrị nke na-enye redio, ụgbọala, elekere na igwe ndị ọzọ ọkụ.

Ọ dị mkpa na e wezugara ya n’ebe aka ụmụaka agaghị eru ya.

Dịka Dkta Abiola si kọwaa, itinye batịrị n’ọnụ maọbụ ilo ya elo nwereike ibute ihe Bekee kpọrọ ‘Lead poisoning’ dịka ‘lead’ maọbụ alkaline e jiri mee ya ihiwe ehiwe hiba n’mgbụrụ afọ nke nwere ike imerụ nwata nnukwu ahụ n’ime, bute ụkọ ọbara maọbụ ọnwụ.

Ihe ọzọ dị mkpa bụ ịgba mbọ hụ na i debeghị batịrị na nso ọkụ, mmiri maọbụ tụnye ya n’ọkụ ma ọ nwụọ.

5. ‘Bleach’ na mmanụ ọkụ (kerosene) na kemịkal ndị ọzọ

Ụfọdụ kemịkal ị na-edowe n’ụlọ maka igbo mkpa ụfọdụ dịka nke eji asụ akwa Bekee a kpọrọ ‘Bleach’, nke a na-atụnye na mmiri maka igbu nje (disinfectant), nwere ike ịghọ ‘oduchiegbu’ ma ọ bụrụ na ị kpachapụghị anya, ọ kachasị ma i nwee ụmụaka.

Ụfọdụ okenye nwere ike amaghị ama buru mmiri kemical gbanye na nri maọbụ gbanye n’ọkụ nke nwere ike ibute ọdachị atụghị anya.

Ụfọdụ agbaala ụlọ ọkụ maọbụ rie ‘nsị’ na-emerụ ahụ n’ihi ụdị ndajọ a.

Otu ahụike mba ụwa WHO kwuru na ịna-ekuru kerosene oge ọbụla nwere ike ibute nsogbu mgbakasị arụ, ihe ọdịdọ, ajụ obubu, maọbụ ọnwụ.

Dkta Abiola na-atụ alọ sị, “Ekwela ka ọ dị ebe aka ụmụaka ga-eru ya.”

“Dee ha aha nke ọma ka mmadụ ghara iburu ha ṅụọ kpọọ ya ihe ọzọ.”

Ndị dọkịta na-adụ ọdụ ka ị ghara ịgwakọ ‘bleach’ na ‘ammonia’.

Ha kwuru na ịgwakọ ha abụọ nwere ike iwepụta anwụrụ nke nwere ike imebi ihe n’ime ahụ gị ma i kuru ya.

Kpachapụanya ebe ị na-atufu komkom kemical gwụrụ agwụ.

6. Ọkụ

Ihe ndapụta ọkụ latrik nwere ike isite n’ụdọ ọkụ ekpuchighị ekpuchi ọfụma maọbụ nke oke tara.

Ọkụ ọgbụgba nwere ike ibute anwụrụ ikogbu mmadụ.

Ọkụ nwekwara ike imerụ mmadụ ahụ maọbụ gbagbuo mmadụ maọbụ mee mmadụ iji ụjọ wutuo n’elu maọbụ gbaa ọzọ n’ụzọ nwere ike ibute nnukwu mmerụahụ maọbụ ọnwụ.

Dkta Atiba kwuru sị, “onye ọbụla kwesịrị inwee igwe mmenyụọkụ n’ụlọ, igwe mgbamaọkụ nkwa akwa mmenyụọkụ.”

“Gbanyụọ isi ebe ọkụ latrik ahụ si apụta ka ‘oxygen’ na-eme ka ọkụ ahụ na-enwu gbanyụọ.”

“Ejila mmiri emenyụọ ọkụ si na ọkụ latrik malite.”

“Ọkụ na-agba, were mmiri na-agbọ ụfọfụ menyụọ ya”

Abiola kwuru mkpa ọ dị ibeku ndị ụlọọrụ na-emenyụ ọkụ. “Ezinaụlọ ọbụla kwesịrị inwe ekwentị ndị ụlọọrụ na-agbanyụ ọkụ.”

7. Ala na-amị amị na ọba nsaahụ (Bathtub)

Ihe na-atọ ụtọ na-egbukwa egbu. Ọba asamahụ (bathtub) bụ ihe na-eneyere mmadụ aka ịsama ahụ n’ụzọ dị ụtọ mana o nwere ike ibutere mmadụ ọdachi ịgbajị ụkwụ, ukwu maọbụ kpụkpụ aka.

Nwaanyị dị ime etiela afọ n’ala maka ịsa ahụ n’ime ọba asamahụ enweghị nchekwa ọbụla.

Onye mmanya na-egbu maọbụ onye ahụ adịghị nwekwara ike ịda kụọ isi maọbụ akụkọ ndị ọzọ n’ala n’ihi ala ọmịmị.

N’ihi ndị ndapụta dị otu a, Dkta Abiola, nyere ndụmọdụ sị, “Gba mbọ tinye ute ụkwụ nwere eze n’ebe a na-asa ahụ.”

“Gba mbọ hụ na ịkwafughị mmiri n’ala . Ịkwafuo mmiri, i fichapụ ya ozigbo.”

8 . Ebu (mould)

Dịka Dkta Abiola siri kọwaa, ebu dị na nri maọbụ na ebe ụfọdụ n’ụlọ nwere ike ibute nsi nri (food poisoning).

Gbaa mbọ hụ na ebu anaghị eto n’ime ụlọ asamahụ gị.

9. Mma, ngaji na ngwa ndị ọzọ dị nkọ

N’usekwu ka ihe mberede na-emekarị; ọ bụghị ọkụ, ọ bụrụ mmiri maọbụ ọ bụrụ ngwa ike e ji eme ihe dịka mma, ngajị na ihe ndị ọzọ e ji esi nri na ngwa ndị dị nkọ.

Ihe ndị a nwere ike imerụ mmadụ ahụ maọbụ bute nsogbu ahụike.

Dkta Akiba nyere ntuziaka ka “i wezuga mma na ihe ndị ọzọ ga-emerụ mmadụ ahụ ebe aka ụmụaka agaghị eru ha”.

10.Igwe na-enye ọkụ

Ọtụtụ ezinaụlọ ekpochapụla n’ihi ịdọba igwe na-enye ọkụ n’ebe ekwesịghị.

N’afọ 2019, anwụrụ si n’igwe na-enye ọkụ kpochapụrụ ezinaụlọ mmadụ asaa; nne, nna na ụmụaka ise n’Ikwerre Rivas steeti.

Dịka ndị ọkachamara si kọwaa, igwe na-enye ọkụ na-ewepụta anwụrụ nke nwere ikuku Bekee kpọrọ ‘carbon monoxide’.

Dọba igwe ọkụ gị ebe anwụrụ ya ga na-apụ apụ.

Mmanụ ‘petrol’ a na-agbanye n’igwe ọkụ ekwesịghị ịdị n’ime ụlọ. Debe ya na mpụga ebe aka ụmụaka agaghị eru ya.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *