Iru mgbede bụ omenala na-emetụta naanị ụmụnwaanyị n’ala Igbo mgbe gboo.
Na mgbe gboo ahụ, nwaanyị agaghị alụ di ma o rughi mgbede.
Ọtụtụ obodo na-emere ya ụmụagbọghọ ruru afọ iri abụọ maọbụ karịa.
A na-akpọ ya aha dị iche iche n’obodo dị iche iche dịka: iru mgbede, ịda mgbede maọbụ ịba mkpuke.
Otu onye nkuzi banyere omenala na asụsụ Igbo na mahadum Ebonyi Steeti bụ Mercy Onụ sị na Iru mgbede dị n’ime Olo bụ emume nkwado ụmụagbọghọ maka alụm di.
Ọ sị na “iru mgbede bụ emume nne na nna na-emere ụmụ ha ndị nwaanyị tozurula ịlụ di.”
“Ọ bụ oge e ji akpọba ha n’ụlọ, leta ha anya nke ọma”.
Mgbe ahụ, ha agaghị arụ ọrụ ọbụla.
O nweghi ihe mgbakasị ahụ aga ekwe ka ọ metụta ha.
Onye ọkammụta Igbo na Mahadum Legọs bụ Chigozie Nnabụihe kwuru na ọ bụ oge nwaanyị hụrụ nsọ ya izizi bụ mgbe o ji aga iru mgbede.
Nnabuihe sị na “ma a kpọrọ ya iru mgbede, ma a kpọrọ ya idu mgbede maọbụ ịnọ mkpuke, ihe a niile bụ ịkwado nwaanyị maka alụm di”.
Ọ sị na ọ nwere ụlọ a na-arụpụrụ ndị mgbede bụ ebe ụmụnwoke anaghị aba.
Ọ sị “naanị ụmụnwaanyị, ọkachasị ndị nne na-aba ebe ahụ. Ha na-aga akụziri ndị na-eru mgbede etu e si ebi dịka nwaanyị nakwa nwunye n’ezinaụlọ”.
O kwuru na ụmụnwaanyị na-aba n’ụlọ megbede dịka ụmụaka ma pụta dịka agbọghọ tozuru etozu.
Nnabuihe sị na nwaanyị ọbụla si iru mgbede pụta etozuola ịlụ dị.
Mercy Onu na Nnabuihe kwekọrịtara na a na-eru mgbede n’ebe ụfọdụ mgbe nwaanyị hụrụla onye chọrọ ịlụ ya.
Nnabuihe gbakwunyere “e mechaa mgbede e si ebe ahụ dupu nwaanyị ahịa, o sizie ebe ahụ lawa be di ya”.
Mgbe nke a mere, nwaanyị ahụ pụtazie ahịa, ụmụokorobịa hụ ya, ha amata na o ruola ihe eji nwaanyị eme.
Onu kwukwara na nwaanyị na-eru mgbede anaghị aga ozi siri ike.
Ọ sị na “Naanị ihe ọ na-eme bụ iri nri na idozi onwe ya”.
O kwukwara na ụfọdụ n’ime ihe dị na ọzụzụ ha na-enwete bụ maka ụmụnwoke.
N’okwu ya “A na-akụziri ha etu e si elekọta nwoke anya.”
“Ana akụzikwara ha etu e si elekọta ụmụaka nakwa ndị be di ya anya.”
Ndị nne nwaanyị ndị ọzọ na-akpọtara ha ụmụ ha dị nta ka ha lekọtara ha anya mgbe ha na-aga ahịa maọbụ ugbo.
Nke a bụ ọzụzụ maka nlekọta ụmụaka anya n’ezinụlọ.
A na-eru mgbede ihe dịka ọnwa atọ maọbụ karịa, dịka aka ha ezinaụlọ nke nwaanyị.
A na-ete ụmụnwaanyị nọ na mgbede uhie maọbụ uri nke ga-eme ka ahụ ha na-akwọ mụrụ ma mee ka mma ha pụta ihe.
Otu nwaanyị aha ya bụ Ogonnaya Ihebinandu kwuru na Arochukwu nwere ụdịrị iru mgbede abụọ.
Ọ sị na e nwere nke a na-emere ndị lụrụla di, nwekwa nke a na-emere ụmụ agbọghọ na-alụbeghi di.
O kwuru na “di ji ego nwereike ime ka nwunye ọ lụrụ ọhụrụ rụọ mgbede”, iji kuziere ya etu e si achịkọta ezinaụlọ.
Kedụ uru iru mgbede baara ndị Igbo?
Otu n’ime omenala kachasị mkpa ndị Igbo na-eme bụ alụmdinanwunye.
Njem alụmdinanwunye na ndụ ndị Igbo abụghị ihe jee taa lọta echị.
Nwaanyị agaghị atụrụ ime ma o rughi mgbede.
A na-ahụ nwaanyị na-emeghi etu a dịka ajọ nwa.
Dịka onye mechuru ezinaụlọ ihu nke bụ na-ana eji azịza azapụ ukwu ya n’ezi.
N’ihi nke a, a na-akwado nwaanyị nke ọma tupu agawa ije di ka ọ ghara ibu ya aka mgbe o ruru be di ya.
Ụfọdụ ọghọm erughi mgbede n’ala Igbo?
Nnabuihe chere na-erughị mgbede mere ọtụtụ alụmdinanwunye nakwa ezinaụlọ ji agbasa ugbua.
Ọ sị na “e meghi mgbede mere ọtụtụ ụmụagbọghọ ji atụta ime mkpuke”.
A na-akụziri ha na nwaanyị ịgba n’ezi bụ ajọ ihe ma bụrụkwa ihe ihere.
Gịnị mere iru mgbede ji laa n’ala Igbo?
Iru mgbede lara maka ọgbara ọhụrụ Bekee butere.
Mgbe ndị Bekee batara n’ala Igbo ma malite ịchị, ha butere omenala nke ha ma kachapụ ọtụtụ nke ndị Igbo.
Ọtụtụ nne na nna na-ahụtazị iru mgbede dịka ihe agba ochie.
Ụfọdụ na-ahụta ya dịka ihe ịgọ mmụọ.
N’ọtụtụ ebe, ịgụ akwụkwọ na e nweghi ohere emeela ka iru mgbede laa ka ọnwa.
Obodo na-eru mgbede n’ala Igbo
Nnabuihe sị na ọtụtụ obodo na-eru mgbede n’ala Igbo mgbe gboo.
Ọ sị na obodo ndị dịka Umuahia na-akpọ ya ịbauke.
Ndị Ọka nke Anambra na-eme ya.
Arochukwu na-emekwa ya, ha na ndị Ohafia.
Ndị Ngwa na-eme ya.
Mgbidi na-akpọ ya ịkwaezi.
Nwagbọghọ maara nwoke ma ọ kwaghị ezi (o rughị mgbede), nne ya na-eji azịza zapụ ya n’ezi.
Ndị Edda sị na iru mgbede dị n’ime Olo ha na-eme be ha.
Leave a Reply