Take a fresh look at your lifestyle.

Onye Ndu Naijiria Ekeleela Bola Tinubu Maka Agbamafọ Iri Asaa Na Otu

Timothy Choji dere ya na bekee

0 378

Onyeisiala Naijiria, Muhammadu Buhari enwela ọñụ n’isi onyeisiala a họpụtara ọhụrụ, Bola Tinubu dịka ọ na-agba afọ iri asaa na otu n’abalị iri na itoolu ọnwa Maachị 2023, nakwa na nkwadebe idu obodo a site n’ọnwa Mee.

Onyeisiala sonyeere ndị ezinaụlọ onyeisiala ọhụrụ, ọ kachasị nwunye ya, Sịnetọ Oluremi Tinubu, ndị mmekọ azụmahịa na ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-enwe aṅụrị ịgba afọ a dị ịrịba ama, nke jupụtara n’ọtụtụ afọ ahụmahụ na ihe ọ rụpụtara na ụlọ ọrụ nke onwe na nke ọha ma kwadebe ya maka mmeri nke ọnwa Febụwarị, 2023.

Onyeisiala Buhari kwenyere na ịhụnanya, enyi na mmesapụ aka nke Tinubu ewepụtala ụzọ maka mmekọrịta ndị enyi, n’ụlọ na mba ụwa, nke ga-eme ka ọchịchị ya duzie akụ na ụba ma kwado ihe mmepụta nke ndị ndu gara aga.

“Dị ka ọ na-akwado iweghara ikike nke onye ndu, Ọnyeisiala na-ekwusi ike na njirimara Tinubu na ndọrọ ndọrọ ọchịchị sitere na 90’s, ọ rụsiri ọrụ ike na ndọrọ ndọrọ ọchịchị paati, a họpụtara ya ka onye Sịnetọ emesiakwa dị ka Gọvanọ Lagos Steeti. Ọdị uchu itinye aka na nhazi nke ndu na na ọkwa ndị omebe iwu ruo ọtụtụ afọ,”

President Buhari prays for the wellbeing of Asiwaju and his family.
Onyeisiala Buhari kpere ekpere maka ọdịmma Asiwaju na ezinụlọ ya.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *