Take a fresh look at your lifestyle.

Dikko Radda emeriela ntuliaka gọvanọ steeti Katsina

Zubairu Mohammed dere ya na bekee

0 339

Onye ndọrọ-ndọrọ ọchịchị All Progressives Congress, APC, Dr. Dikko Radda emeriela ntuli aka ọkwa gọvanọ nke abalị iri na asatọ ọnwa Maachị na Katsina Steeti, mgbago ugwu Naijiria.

Onye na-ahụ maka
nkwuwapụta na ntuli aka ahụ, Prọfesọ Mu’azu Abubakar, sitere na Mahadum Gusau, kwupụtara Maazị Radda dịka onye meriri na ntuliaka ahụ ka ọ tụlechara nsonaazụ sitere na kansul iri atọ na anọ nke steeti ahụ.

Maazị Radda nwetara vootu 859,892 iji merie onye otu Peoples Democratic Party (PDP), Yakubu Lado, onye nwetara 486,620 vootu.

Onye otu ndọrọndọrọ New Nigerian Peoples Party, NNPP, Nura Khalil, nwetara vootu 8263, Imran Jino nke Peoples Redemption Party, PRP, nwetara vootu 4,226 ebe Ibrahim Zakari nke Social Democratic Party, SDP, nwetara vootu 1,049 ebe onye otu Labour Party, Abu Musawa. nwetara vootu 560.

Ndị ndọrọndọrọ iri na atọ sonyere na  ntuli aka ahụ. Gọvanọ Aminu Masari nọ n’ọchichi ugbu a etozughị isonye n’ihi ọ nọ na ngwụcha ọchịchị nke ugboro abụọ iwu kwadoro.

Prọfesọ Abubakar kwuru; “ọnụọgụ ndị debanyere aha ịtụ vootu na steeti Katsina guzoro na 3,516,719 na ndị pụtara ịtụ vootu bụ 1,399,291. Ngụkọta votu ziri ezi guzoro na 1,365, 848 ebe a jụrụ 20,579. Ngụkọta votu e mere na ntuliaka gọvanọ bụ 1,386,427.”

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *