Take a fresh look at your lifestyle.

EFCC si anwụchiela ndi na-azụ vootu ndị mmadụ n’oge ntuliaka

0 356

Ụlọọrụ ebuso mpụ na nrụrụaka agha na Naịjirịa bụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) kwuru na ha nwụchịrị mmadụ iri isii na ise n’ụbọchị Satọdee oge e mere ntuliaka ọkwa gọvanọ na ndị ụlọomeiwu steeti na Naịjirịa.

Ha kwuru na ndị a nwụchiri bụ nọ na-agba mbọ inye ndị mmadụ ego ma zuru vootu ha.

Ha kwuru na ha nwụchiri mmadụ iri abụọ n’Illorin, iri na otu na Kaduna, nakwa mmadụ iri na abụọ na Port Harcourt oge ha nọ na-azụ vootu ndị mmadụ.

Ndị EFCC kwukwara na ha nwụchịrị mmadụ anọ na Calabar, Uyo steeti ebe ha nwụchiri ndị ọzọ n’akụkụ Gombe, Sokoto, Kebbi na Niger steeti.

EFFC kwuru na “N’oge anyị nọ na-agba ha ajụjụ ọnụ, ụfọdụ n’ime ha kwuru na ha bụ ndị nnọchiteanya ụfọdụ pati”.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *