Take a fresh look at your lifestyle.

Ụlọ Ọrụ Nchekwa Iwu Okporo Ụzọ Ga-Ewulite Ngalaba Area Command N’ime Anambra

Chinwe Onuigbo dere ya na Bekee

0 291

Onye isi oche ọchịchị nchere oge nke okpuru ọchịchị IdemilI North n’ime steeti Anambra, Maazị Chuks Igboanua, etoola ndị ọrụ nchekwa iwu okporo ụzọ bụ Federal Road Safety Corps (FRSC), maka mkpebi iwulite otu n’ime ụlọ ọrụ ha na mpaghara Idemili North.

Mgbe ọ gara n’isi ụlọ ọrụ kansụl ahụ dị n’Ogidi, Maazi Igboanua toro osote onye isi na-ahụ maka ngalaba ụlọ ọrụ kansụl Anambra steeti bụ Oriakụ G. I. Omeke maka nkwenye ya n’ọrụ.

Oriakụ Omeke n’okwu ya, chetaara onye isi kansụl ahụ na ebumnuche ọbịbịa ya bụ ịkọwara ya mkpebi FRSC mere nso nso a ịrịọ steeti ọ bụla na Naijiria ka ha wulite ngalaba ụlọ ọrụ abụọ na mpaghara ha.

N’okwu ya, “Nke a ga-adị iche na ụlọ ọrụ iri na abụọ dị ugbu a na-ahụ maka ngalaba ndị nwere nkeji 725, yana ụlọ ọrụ ọdụ ndị emere ihe dị ka afọ atọ gara aga.”

Oriakụ Omeke kwuru na o tinyere ngwa ọrụ nke ụlọ ọrụ ya dị ka onye isi na-ahụ maka FRSC na mpaghara kansụl iri abụọ na otu e nwere, ọ chọpụtara na Kansụl Idemili North pụrụ iche n’etiti kansụl ndị ọzọ, site na ntụle e mere.
Onye isi ọrụ FRSC kelere onye isi oche nchere oge ahụ maka inye ya na ndị otu ya ohere inwe mkparịta ụka.

A ga-echeta na onye isi ọhụrụ Corps Marshal nke FRSC, Dauda Ali na mmalite ọrụ ya n’ime afọ ọhụrụ a kpebiri itinyekwu mbawanye nke ụlọ ọrụ ahụ site na iwulite Area Command n’ime steeti iri atọ na isii nke obodo a.

 

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *