Take a fresh look at your lifestyle.

Libya Emeela Ncheta Afọ Iri Na Abụọ Achụtulu Moammar Gadhafi

0 366

Ndị Libya nọọrọ na Fraịde mee emume ncheta afọ iri na abụọ nke ọgba aghara afọ 2011.

E nwere nnukwu mmemme n’ọtụtụ obodo na n’isi obodo bụ Tripoli, ebe ndị bi na ya gara n’okporo ama ebe e ji ọkọlọtọ na ọkụ chọọ mma iji mee mmemme.

Ihe ngosi egwu nke ndị na-abụ abụ na ndị egwu Libya dọtara nnukwu igwe mmadụ na nnukwu ogige Tripoli. E nwere nnukwu ihe ngosi ndị agha n’ama obodo ahụ dịka akụkụ nke emume.

“Ana m ekele ndị Libya na emume ncheta afọ iri na abụọ nke mgbanwe abalị iri na asaa ọnwa Febụwarị, ma ọ bụrụ na Chineke chọrọ, anyị gana akawanye mma. Ọ bụrụ na mmasị Chineke, anyị ga-enwe ọchịchị nke ndị Libya niile họpụtara n’afọ n’abia. Libya ga-ejikọta ọnụ wee ghọọ otu obodo.” Rabie Imran, otu n’ime ndị ikom na-eme mmemme n’okporo ama Tripoli kwuru.

Emume ncheta ọgbaghara a na-abịa n’etiti ọgba aghara ndọrọ ndọrọ ọchịchị na nkewa gọọmentị na-aga n’ihu, ebe enweghị ike ịme ntuli aka kemgbe Disemba afọ 2021.

Gọọmenti obodo ahụ kewara ụzọ abụọ n’ihi ọgbaaghara a sochiri, nke ọbụla nwere ndị agha nnupu isi dị iche iche na gọọmentị mba ofesi na-akwado ya.

Onye nnọchi anya UN pụrụ iche maka Libya dọrọ aka ná ntị na njedebe afọ gara aga na ihe ịrịba ama nke nkewa apụtalarị ma gbaa mba ndị nwere mmetụta ume ka ha rụgide ndị ndu Libya ka ha mechaa usoro iwu ngwa ngwa maka ntuli aka.

N’abalị iri na asaa ọnwa Febụwarị afọ 2011, Libya dabara n’ime ngagharị iwe yiri nke e nwere n’ọtụtụ mba Arab n’oge ahụ. (Arab Spring). Ndị mmadụ malitere ọgbaghara nke kwaturu ọchịchị aka ike Colonel Moammar Gadhafi mana nchụpụ nke Gadhaffi na-echetakarị ntinye aka NATO.
.
Njikọta nke gụnyere France, Britain na United States malitere mbuso agha mbụ megide ndị agha Gadhafi n’okpuru mkpebi United Nations iji chekwaa ndị nkịtị n’abalị iri na itoolu ọnwa Maachị afọ 2011. NATO weghaara ikike mbuso agha n’ikuku Libya n’abalị iri atọ na otu ọnwa Maachị.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *