Take a fresh look at your lifestyle.

Onyeisiala Buhari Ga-Agbaghe Ihe Nrụpụta Ọkụ Latrik Na Kano Steeti

Jack Acheme dere ya na Bekee

0 314

Onyeisiala Naijiria, Muhammadu Buhari ga-aga njem ụbọchị abụọ na steeti Kano, ebe ọ ga-agbaghe ihe nrụpụta ọkụ latrik na nnukwu ụlọ ọgwụ ọrịa cancer.

Kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka mgbasa ozi na ihe gbasara ime obodo bụ Mohamed Garba kwuru nke a na mkparịta ụka ya na ndị nta akụkọ nwere na Kano steeti.

O kwuru na ọrụ ọkụ latrik na ụlọ ọgwụ ọrịa cancer so n’ihe nrụpụta asaa a na-atụ anya na Onyeisiala ga-agbaghe na njem nleta abalị abụọ ọ ga-eme na steeti ahụ malite n’abalị iri atọ ruo na abalị iri atọ na otu nke ọnwa a.

Dị ka o si kwuo, ọrụ ngo Tiga dam ga-eme ka ọkụ dịkwuo mma n’ụlọ ọrụ dị iche iche, ọrụ mmiri na steeti ahụ ọkachasị ụlọ ọrụ mmiri Tambrawa ma kwalite nchekwa, n’ihi na a ga-eji ya na-enye ife n’okporo ụzọ n’ime steeti ahụ.”

O kwuru na nnukwu ụlọ ọgwụ ọrịa cancer ahụ bụ nke kachasị na West Africa, ga-eme ka ọ dị mfe ịnweta ọgwụgwọ ọrịa cancer n’ọnụ ala na mpaghara steeti ahụ ma gụnyekwa mba ndị agbata obi.

Ọ sịrị, “Ọ ga-ebelata njem ahụike maka ndị Naịjirịa na-aga mba ofesi maka ọgwụgwọ ọrịa cancer ma chekwaa ego mba ofesi maka obodo,”

Onye isi ala Buhari ga-agbaghekwa ụlọ obibi nke ndị nkuzi iji belata ihe ịma aka ụlọ ebe obibi.

Ihe ndị ọzọ a ga-agbaghe n’oge njem nleta ahụ gụnyere: Dangote ultra-modern Skills Acquisition Center, Dala Dry Inland Port na ụlọ ọrụ ọkụ latrik enwetara n’anyanwu.

 

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *