Take a fresh look at your lifestyle.

Ndị Omebeiwu Ga-enyocha Ebubo Ntufu Ego Sitere Na Ire Mmanụ N’ụzọ Iwu Akwadoghị.

0 321

Ụlọ omebeiwu ekpebiela iguzobe kọmitii nchere oge ga-enyocha ebubo maka ire mmanụ Bonny Light crude nke dị nde barrel iri anọ na asatọ n’afọ 2015 yana ọnọdụ insurance ibu ahụ.

Ebubo ire mmanụ ahụ n’ụzọ megidere iwu buteere Naijiria ofufu ego ruru ijeri Dollar abụọ na ụma anọ ($2.4 Billion) .

Nke a sochiri nnabata akwụkwọ mkpebi nke gbadoro ụkwụ na “Alleged Loss of over $2.4 Billion in Revenue from Illegal Sale of 48 Million Barrels of Crude Oil Export in 2015 including Crude Oil Exports from 2014 till date” nke Hon. Isiaka Ibrahim kwadoro n’ụlọ omebe iwu ahụ.

Ụlọ omebeiwu ahụ kpebikwara inyocha mmanụ niile Naijiria bupụrụ ma ree site n’afọ 2014 ruo taa n’ihe gbasara ọnụọgụgụ, insurance , ego e etinyere n’akpa gọọmentị etiti ma ọ bụ akaụntụ ndị ọzọ yana ihe ndị e ji ego ndị a mepụta n’ime oge a na-enyocha.

Ọ ga-enyochakwa ego niile enwetara site na amụma Whistle-blowers Policy.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *