Take a fresh look at your lifestyle.

Mwakpo ndị ‘bandit’ ga-abụ ihe ochie ma m banye n’ọchịchị – Tinubu gwara ndị Kaduna

0 429

Bola Ahmed Tinubu, onye ji ọkọlọtọ ndị ‘All Progressives Congress’ (APC) azọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa ekwuola na ya ga-eweta nsogbu mwakpo ndị ekperima ‘bandits’ n’isi njedebe na Kaduna Steeti, ma ọ bụrụ na ya merie na ntuliaka 2023.

Tinubu kwere nkwa a oge ọ gara n’obieze Emir nke Birnin Gwari bụ Mallam Zubairu Maigwari, dịka ụgbọ achụmnta vootu ndị APC garuru na Kaduna n’ụbọchị Mọnde.

Birnin Gwari bụ mpaghara Kaduna steeti ebe ndị badit wakporola aghara aghara n’afọ a.

Tinubu gwara Emir ahụ sị: “Akwụ m n’ihu gi iji kwe gị nkwa na ohere ọma na-abịa. Ntuliaka eruola nso. Nkwa anyị na-ekwe bụ na anyị agaghị ezu ike ruo mgbe anyị kpochapụrụ nsogbu ndị ‘bandit’. Ana m ekwe nkwa na anyị ga-akpọ ya mkpa.”

@Babanyayaa/TwitterCopyright: @Babanyayaa/Twitter

Emir nke Birnin Gwari chiri Tinubu na El-Rufai echichi iji kelee ha maka nleta ha.Image caption: Emir nke Birnin Gwari chiri Tinubu na El-Rufai echichi iji kelee ha maka nleta ha.

Zubairu Maigwari, bụ Emir Birnin Gwari, kelere Tinubu maka ịbụ onye mbụ na-azọ ọkwa onyeisiala nke katara obi bịa ileta ha na mpaghara ahụ iji kasie ha obi.

I ji kelee ya nke ọma, Maigwari chiri Tinubu echichi ma kpọọ ya ‘Dakare nke Birnin Gwari’, ma chikwaa gọvanọ Kaduna Steeti bụ Nasir El-Rufai echichi ‘Sadaukin Birnin Gwari’

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *