Take a fresh look at your lifestyle.

Ụlọ Omebe Iwu Naijiria Chọrọ Inyocha Ụtụ Isi Na Nkagbu Ụtụ Isi A Na-Enye Ụlọ Ọrụ

Edwin Akwueh dere ya na Bekee

0 849

Ụlọ omebe iwu Naijiria ekpebiela inyocha ụtụ isi, nkagbu ụtụ isi na ego nkwado dị iche iche gọọmentị etiti na-enye ụlọ ọrụ dị iche iche.

Mkpebi nke sinetị ahụ bụ ihe dapụtara mgbe a gụchara nke ugboro abụọ akwụkwọ mmegharị iwu nke na-achọ imezigharị iwu Federal Inland Revenue Act nke 2007, iji nye aka inwe otu ụlọ ọrụ na-ahazi nkagbu ụtụ, mbelata ụgwọ mbubata ahia, na ego nkwado ụlọ ọrụ dị iche iche.

Ọtụtụ n’ime ndị sinetọ kwadoro akwụkwọ mmeghari iwu a, ma na-ekwu na Naijiria ekwesịghi ịga n’ihu na-enye nkagbu ụtụ ma gaa n’ihu na-ebi ego iji gboo mkpa ya dị iche iche.

Onye isi oche sinetị, Ahmad Lawan, mgbe o nyefere akwụkwọ mmegharị iwu a n’aka kọmitii na-ahụ maka ego, kwadoro na a ga-ewepụta kọmitii nchere oge iji mee ka okwu nile pụta ihe, ma nyere gọọmentị aka ịchụ nta ego ya.

“Anyị nọ n’oge ihe isi ike ugbua, mana oge e mebere ụfọdụ n’ime iwu ndị a, Naijiria na-enwe mmụba akụ na ụba sitere na mmanụ mgbe gọọmentị enwechaghi mmasị ịchụ ego site n’ụzọ ndị ọzọ.

“Ma ugbu a, ọnọdụ ahụ agbanweela, anyị makwaara nke ọma, nke mere anyị ga-eji nyere gọọmentị aka ịchọpụta ebe ndị ọzọ na-enweta ego ọkachasị na mpaghara ndị na-abụghị mmanụ,”  o kwusiri ike.

Sineti agụọla nke ugboro abụọ, akwụkwọ mmegharị iwu nke na-achọ imezigharị usoro mbubata na mbupụ ngwa ahia nke Naijiria, ya na inye ikike site n’iwu, amụma gọọmenti itinye ego na nlekọta nke mmadụ.

Akwụkwọ mmegharị iwu atọ ndị agụpụtara nke ugboro abụọ ka e zigaara kọmitii e mebere maka ha, ma nye ha ikike ịzaghachi n’ihu sineti n’ime izu ụka anọ.

 

Ike Umenaba

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *