NAFDAC dọrọ aka ná ntị megide iji ọgwụ na-adịghị mma.
(NAFDAC) adọọla aka na ntị megide iji ngwa ahịa adịgboroja na-adịghị mma.
Dị ka ụlọ ọrụ ahụ si kwuo, ngwaahịa adịgboroja na nke na-adịghị mma abụghị nanị na o na-emebi ahụ ike mmadụ kamakwa na-anọgide na-abụ otu n’ime ihe mgbochi ndị na-egbochi uto akụ na ụba na mmepụta ihe.
Mazị Muyiddin Suleiman, onye nhazi, NAFDAC, na Steeti Kebbi kwuru nke a na mkparịta ụka na Birnin Kebbi,Steeti Kebbi na Fraịde.
Agbanyeghị, o kwuputara na a naghị ahụkarị kemịkalụ na ọgwụ adịgboroja na steeti Kebbi n’ihi na steeti ahụ abụghị nnukwu ahịa maka ọgwụ,
Onye nhazi ahụ kọwara na dabere na nyocha ndị e mere na mpaghara ahụ, ha enweghị nnukwu nsogbu nke ngwaahịa adịgboroja.
Leave a Reply