Gọvanọ Soludo toro atụmatụ imegharị Naira nke CBN.
Gọvanọ steeti Anambra, ma bụrụkwa onyeisi ụlọ akụ ukwu nke Naijiria n’oge gara aga, bụ Charles Soludo, ekwuola na steeti ahụ ga-emezigharị ma soro n’usoro iwu nhazigharị naira ọhụrụ nke CBN.
Soludo sị n’ ọdị mma ka ụlọ ọba ego ukwu na-emezighari ego kwa mgbe ọ bụla.
O kwuru nke a mgbe ọ na-aza ajụjụ na mmemme telivishọn.
N’ọnwa gara aga, Gọvanọ CBN kwuputara na a ga-emegharịgharị akwụkwọ nde naira 200, 500 na 1000.
Ọ gbakwụnyere nke a, “n’oge nke m, emegharịrị ya. E megharịrị N5, N10, N20, na N50.
Leave a Reply