Take a fresh look at your lifestyle.

Gọvanọ Edoziela Nsogbu APC Na Steeti Kano

Jack Acheme

0 313

Ọgbaghara dapụtara n’otu pati All Progressives Congress, APC nke Kano steeti dị na mgbago ugwu Naijiria bụ aka na-achị steeti ahụ bụ Dọkịta Abdullahi Umar Ganduje doziri ya.

Nnukwu onye isi ndị ụlọ omebe iwu, Alhassan Ado Doguwa kwupụtara nke a n’ụbọchị Tuzde na steeti Kano.

Otu ahụ nọ n’ọgbaghara, n’oge na-adịbeghị anya, dịka Ado Doguwa na-anọchite anya Tudun bụ ngalaba gọọmenti etiti Wada/Doguwa, na Murtala Sule Garo, onye na-azọ ọkwa osote gọvanọ n’APC nọrọ n’ọgụ ịkọ ọnụ.
Doguwa kwuru, “Gọvanọ Ganduje  mere ka mụ na Murtala Sule Garo dị n’mma ọzọ ka anyị nwechara nzukọ awa ise”.

“Ndị nọ na nzukọ a bụ Nasiru Aliko Koki na onye isi oche APC steeti, Abdullahi Abbas. Nzukọ a malite n’elekere iri na otu nke abalị Mọnde ruo elekere anọ nke ụtụtụ taa. ”
“Anyị tụlere nsogbu ahụ ma rịọ onwe anyị mgbaghara. Gọvanọ gwara anyị okwu ọma. O gosiri onye ọ bụla n’ime anyị ebe anyị mejọrọ. O nyere ndụmọdụ ma kwuo na ya weere anyị abụọ ka ụmụ ya.”
O kwusiri ike na ya etinyela okwu a n’azụ ma gaa n’ihu na mkpebi ya maka APC ime nke ọma na ntụli aka afọ 2023 na steeti Kano nakwa obodo Naijiria dum.

“Anyị ekpebiela ime udo. Agam aga n’ihu na ịkwado APC na ntụli aka 2023. Agam aga n’ihu na-akwado Gawuna/Garo, Tinubu/Shettima, na APC na ọkwa niile na 2023.”

Doguwa kwuru na ya agbagharala Garo na ndị otu pati ndị ọzọ mejọrọ ya. Ọ kpọkuru ha ka ha gbagharakwa ya gụnyere ndị Kano niile na ndị na-akwado APC na steeti ahụ.

Ike Umenaba

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *