Take a fresh look at your lifestyle.

EJIMA N’ALA IGBO N’OGE OCHIE.

0 791

Na mgbe ochie, tutu ọbịbịa ndị Bekee n’ala Igbo, ndị Igbo were ịmụ ejima ka nnukwu ihe arụ. Ọ bụ kwenye ha na naanị ụmụ anụmanụ ka emere ka ha na-amụ ụbara ụmụ. N’ezie, ụdịrị ntaramahụhụ ụmụ nwaanyị mụrụ ejima na-anata abụghị obere ihe. Ọ bụ ya kpatara na o nwe ụmụ nwaanyị na-ese okwu, iyi kachaa njọ ha na-akpọ onwe ha bụ “mụọ ejima.”

N’oge ahụ, nwaanyị mụọ otu nwa, añụrị na ụzụ na-ada ebe niile. A na-agụ egwu nwa, tinyekwara ihe ndịọzọ dị iche iche iji kelee chi wetara nwa. Mana ọ naghị adị otu a ma nwaanyị mụọ ejima n’oge ahụ. Mgbe nwaanyị ime na-eme mụrụ otu nwa, wee na-achọ ịmụ ọzọ, nwaanyị na-anara ya nwa na-ahapụ ya rie mbo mbo ọsọ.

A na-atụnye ụmụ ejima ndị a n’ime nnukwu ite, kechie ọnụ ya, buru ite ahụ tụbanye n’ajọ ọhịa nke mmadụ anaghị aba ma ọlị. Nwaanyị mụrụ ejima ahụ agbanaghịkwa ntaramahụhụ nke ya. Ọ dịghị onye ọ bụla ya na nwaanyị ahụ ga na-emekọrịta. Ọ gaghị agwa ndị mmadụ okwu ma ọ na-aga n’ụzọ. Ọzọ, ọ naghị asa ahụ ebe ndị ọzọ na-asa ma ọ gaa mmiri. Ihe ndị a na-eme ka obi dị nwaanyị ahụ njọ.

Mana ekele dịrị ndị Bekee maka ọbịbịa ha wee weta mgbanwe kwụsịrị ajọ omume igbu ejima. Ha wetara ụka, nke mere ka ụfọdụ ndị Igbo chegharịa bụrụ ndị nke kraịst. Ọ bụ otu a ka ndị Igbo si mata na ejima bụ ngọzi pụrụ iche na-esi n’aka Chineke a bịa. Niihi ya, ha kwụsịrị itufu ejima oge ọ bụla a mụrụ ha.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *