Mmadụ isii ndi a: Adefowora Olanipekun, Adefowora Oluwanisola, Emmanuel Uko, Seyi Oloyede, Avwerosuo Otorudo na Chukwuebuka Ehirim ka
Ọkaikpe Emeka Nwite nke Ụlọikpe Ukwu Etiti dị n’Abuja anabatala arịrịọ ụlọọrụ na-ebu agha megide mpụ na nrụrụaka ego na Naịjirịa bụ EFCC ịnwụchi ha ma jichie ha maka nkwalite atụmatụ CBEX.
Ọkaikpe Nwite nabatara arịrịọ ahụ n’ihi ebubo e boro CBEX igwu ọtụtụ ndị Naịjirịa chandum nke ọnụego ya karịrị otu ijeri dọla ($1bn).
Ọkaiwu na-ekwuchitere EFCC bụ Fadila Yusuf tinyere akwụkwọ n’ụlọikpe ahụ n’ụbọchị 23 Eprel 2025.
BBCIGBO
Leave a Reply