Take a fresh look at your lifestyle.

A ga-ebuga Popu Francis na St Peter Basịlịka maka ọha iru uju

0 231

A ga-ebuga ahụ Popu Francis na St Peter Basịlịka taa bụ Wenezde ebe ọ ga-edina ka ndị mmadụ were malite iru uju.

Dịka etu emume olile Popu ga-esi aga, Kardịnal Kevin Farrell ga-edu n’ekpere tupu e bupụ ahụ Popu ebe ọ dị na Chapel nke Casa Santa Marta, bụ ebe obibi ya.

Oge ọ kụrụ elekere itoolu nke obodo ahụ, a ga-eburu akpati e tinyere Popu nọ n’ebe obibi ya na Casa Santa Marta gawa na St Peter Basịlịka.

A ga-eme ngagharị ga-agafe na Piazza Santa Marta na Piazza dei Protomartiri Romani tupu ha abanye na St Peter Basịlịka.

Kadịnal Farrell ga-ahụ maka usoro ekpere na Okwu Chukwu, nke ga-abụ karị ọtụtụ agụmagụ sitere na Akwụkwọ Nsọ.

Akpati ozu Popu ga-anọzi ebe ahụ ka ọha mmadụ were nwee ike ịkwanyere ya ugwu ikpeazụ tupu mgbe olili ya n’ụbọchị Satọde abali iriabuo na isii nke onwa Eprel afo 2025.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *