Take a fresh look at your lifestyle.

Onyeisiala Tinubu Enyela Mahadum Federal University of Education Aha Ọhụrụ

Temitope Mustapha dere ya na bekee

0 145

Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu agbanweela aha Mahadum Federal University of Education dị na Kano ka ọ bụrụ Yusuf Maitama Sule Federal University of Education.

Ụlọ mmụta ahụ bụ otu n’ime mahadum asaa pụrụ iche nke agụmakwụkwọ n’okpuru ọchịchị etiti.

Onye isi ala ahụ kwuru na Yusuf Maitama Sule Federal University of Education ga-aga n’ihu na-arụ ọrụ dị mkpa n’ịzụ ndị nkuzi, na-eme ka ngalaba agụmakwụkwọ Naijiria sikwuo ike.

E mere ka a mara mgbanwe aha ụlọ akwụkwọ mahadum Federal University of Education n’ụbọchị Mọnde site n’akwụkwọ ozi onye ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala bụ Maazị Bayo Onanuga wepụtara.

Mazị Onanuga kwuru na Onyeisiala Tinubu kwenyere na ime ka ihe ncheta nke Ambasadọ Sule ga-eme ka ndị ọgbọ na-eto eto kwado iguzosi ike n’ezi ihe, ịhụ mba n’anya nakwa ezi agwa.

Ambasadọ Sule, onye jere ozi dị ka onyeisi oche nke UN Special Committee Against Apartheid na Nigeria’s Permanent Representative na United Nations na New York, a mụrụ ya n’afọ 1929, ọ nwụkwara n’afọ 2017.

O nyere aka nke ukwuu na mmepe mmekọrịta ọha na eze Naijiria n’oge ọrụ ya dị ebube.

Yusuf Maitama Sule rụkwara ọrụ dịka Chief Whip of the Federal House of representatives site afọ 1954 ruo 1959,
Onyendu otu nnọchianya Naijiria n’ọgbakọ obodo nweere onwe ha nke afọ 1960,
Federal Komishona Izizi nke Public Complaints (1976),
nakwa Minista nke akụ ịme ala nakwa ọkụ eletrik.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *