Onyeisiala bu,Bola Tinubu agawala mba Tanzania maka ọgbakọ African Energy Summit a ga-eme n’isi obodo ahụ bụ Dar es Salaam.
Gọọmenti Tanzania na ụlọakụ African Development Bank na ụlọakụ World Bank jikọrọ aka achịkọba ọgbakọ African Energy Summit afọ a nke ga-amalite n’ụbọchị Mọnde abali iri abuo na asaa nke onwa Jenụwarị ruo Tuzde abali iri abuo na asato nke onwa Jenụwarị 2025.
Atụmatụ a bụ nke chọrọ ịhụ na ihe ruru mmadụ nde narị atọ nwere ọkụ latrik tupu afọ 2030.
A na-atụ anya na ndị isi mba dị iche iche n’Afrịka na ndị isi azụmahịa ga-eji ohere ọgbakọ tụọ alo ma chepụta atụmatụ African Energy Strategy ga-enweta ọganihu Afrịka ma wulite ọnọdụ ọkụ latrik.
Ụbọchị mbụ ọgbakọ ga-enye ndị mịnịsta ọkụ latrik n’Afrịka ohere iji nwee nrụrịtaụka banyere ọnọdụ ọkụ latrik n’Afrịka.
Leave a Reply