Onyeisiala Tinubu Ekeleela Akwụkwọ Akụkọ ThisDay Maka Agbamafọ Afọ Iri Atọ
Temitope Mustapha dere ya na bekee
Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu ekeleela ndị njikwa na ndị ọrụ akwụkwọ akụkọ THISDAY maka agbamafọ iri atọ.
N’ozi ekele nke onye na-ekwuchitere onye isi ala, Maazị Bayo Onanuga, Onye isi ala jara ndị njikwa nke akwụkwọ akụkọ ahụ mma maka ntinye aka ya n’echiche nke ụlọ ọrụ, na ọchịchị onye kwuo uche ya, na iji nkà na ụzụ eme ihe ọhụrụ na maka ịzụlite ọtụtụ aha ndị a ma ama na ụlọ ọrụ mgbasa ozi. .
Onye isi ala Tinubu kwukwara na ọtụtụ ihe nrite nke akwụkwọ akụkọ ahụ, ndị editọ ya, na ndị odee ya nwetara kemgbe ọtụtụ afọ bụ ihe akaebe pụtara ihe nke akwụkwọ akụkọ ahụ.
Onye isi ala Tinubu kpeere akwụkwọ akụkọ THISDAY ekpere agamnihu n’ime afọ ndị na-abịa.
Prince Nduka Obaigbena bụ onye tọrọ ntọala ụlọ akwụkwọ akụkọ ThisDay n’abalị iri abụọ na abụọ ọnwa Jenụwarị afọ 1995, ụlọ ọrụ mgbasa ozi nwetala aha ọma na Naijiria, na-ebusa ozi nke ọma maka ihe mmemme n’ime Naijiria nakwa mba ụwa.
Leave a Reply