Agụmakwụkwọ na mmepe ndị ntorobịa bụ ihe ọchịchị onyeisiala Bola Ahmed Tinubu lekwasịrị anya. Nwunye onyeisiala Naịjirịa bụ Oluremi Tinubu kwuru nke a.
N’oge mmepe nke okporo ụzọ dị kilomita 2.7 na ụlọ ebe obibi ndị nwoke na nwanyị na mahadum Obafemi Awolowo, Ile-Ife, Osun steeti ka nwunye onyeisiala kwuru okwu a.
“Ewebatala atụmatụ nbinye ụmụ akwụkwọ ego maka nke a ana m arịọkwa ndị ntorobịa anyị ka ha nabata nke a.
Oriakụ Tinubu toro Ooni nke Ife, Oba Enitan Adeyeye Ogunwusi maka ịrụ ụzọ na ụlọ oriri na nkwari maka Mahadum Ife.
O kwuru si na-agbakọ aka juo amiri ọ gbọọ ụfụfụ.
Oriakụ Tinubu kpọkukwara ndị nwunye ndị gọvanọ steeti ka ha nyere aka.Nwunye onyeisiala kagburu ọnọdụ akụrụngwa na Mmahadum a ma kwekwara nkwa inye aka n’iweghachite ebube ya dịka o nyekwara otu ijeri naira site na Renewed Hope Initiative.
Leave a Reply