Take a fresh look at your lifestyle.

Nchekwa: Onyeisiala, Ndị Gọvanọ Na-Atụle Ịnakwere Ndị Uwe Ojii Nke Steeti

Temitope Mustapha dere ya na bekee

0 264

Gọọmenti Naijiria na-ekwu na ha na-atụle ịnakwere ndị uwe ojii steeti iji gboo ihe ịma aka na-arị elu nke enweghị nchekwa na-eche obodo ahụ ihu.

Mịnịsta na-ahụ maka mgbasa ozi, Mohammed Idris, kwupụtara nke a nye ndị nta akụkọ State House na Tọzdee ka nzukọ ime ụlọ n’etiti Onyeisiala Bola Tinubu na ndị gọvanọ na Presidential Villa.

Dị ka O si kwuo, ”A ga-atụlekwu ohere nke ndị uwe ojii steeti mana dịka ọ bụ Onyeisiala Tinubu na ndị Gọvanọ iri atọ na isii nwere otu nkwekọrịta na mkpa ndị uwe ojii steeti dị’

Ọ gara n’ihu kwuo na e kwesịrị ịrụ ọtụtụ ọrụ, na onyeisiala na ndị Gọvanọ ekwekọrịtala n’ịhazi usoro a.

Mịnịsta a kọwakwara na Onyeisiala na ndị Gọvanọ tụlekwara na ọ ga-eme ka ike ọnụọgụgụ nke ndị nchekwa ọhịa wee na-echekwa oke ọhịa na oke ala Naijiria.

“Onye isi ala na ndị gọvanọ atụlegokwa na ọ ga-ekwe omume imeziwanye ike ọnụọgụgụ nke ndị nche ọhịa ka ha wee chekwaa oke ọhịa anyị na oke ala anyị.” Minista ahụ kwukwara.

Nkọwa ndị ọzọ na-abịa

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *