Ntuliaka Amalitela Na Mbaghara Obodo Abuja
Hauwa Gidado, Gideon Landi na Martha Obi dere ya na bekee
Ntuliaka amalitela na Ngalaba Ntuliaka 107, nke dị na Parakakou Street, na mpụga Ahmadu Bello Way na Wuse 2, ebe ọnụ ọgụ ndị pụtara maka ntulimaka dị nta n’oge a na-ede akụkọ a.
Mgbe ọ na-agwa onye nnọchi anya People’s Democratic Party (PDP), Maazị Benjamin Tazan okwu, o gosipụtara nchegbu maka igbu oge na ọbịbịa nke ihe ntuliaka, na-agba ụlọ ọrụ INEC) ume ka ha were ntuliaka niile kpọrọ ihe.
“Ha kwesịrị iwere ihe dị mkpa. Ọ bụghị naanị n’oge ntuli aka onyeisiala ka ha kwesịrị ịdị mkpa,” Maazị Tazan kwuru.
Na-ekwukwa okwu na asụsụ Hausa, onye nnọchianya All Progressives Congress (APC), Maazị Nuhu Jibrin, kwuru na igbu oge ahụ bụ n’ihi ọbịbịa nke ụfọdụ ihe ntuli aka n’oge.
“Ntuliaka a ga-amalite,” ka o kwuru, na-agbakwụnye, “Ọ dịghị nsogbu ma ọ bụrụhaala na ha wetara ihe ndị ahụ, ntuliaka amalite,” Maazị Jibrin kwuru.
Na Kubwa 2, ntuli aka malitere n’oge, mana ruo elekere itoolu na ọkara nke ụtụtụ, ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ na-abịa ebe ahụ dị ntakịrị. N’ime mmadụ 756 debanyere aha, naanị mmadụ ise nọ ebe ahụ n’oge akụkọ ahụ.
Leave a Reply