Onyeagha na-achị mba Gabọn bụ General Brice Oligui Nguema ekwuputala mmasị o nwere ịzọ ọkwa onyeisiala mba ahụ na ntuliaka a ga-ahazi n’ọnwa na-abịa abịa.
Nguema weghaara ọchịchị n’afọ 2023 oge ndịagha chụpụrụ ezinaụlọ Bongo n’ọkwa. O kwere nkwa inyefe ọchịchị n’aka ndị nkịtị oge ahụ.
Ka o sinadị, mba Gabọn ewepụtala iwu ọhụrụ nakwa usoro ntuliaka, nke ndị nkatọ kwuru na a haziri ya iji mee ka onyeagha ahụ nweta ọkwa onyeisiala.
N’ụbọchị Mọnde 3 Maachị 2025, Nguema gwara ndị Gabọn na ya ekpebiela ịzọ ọkwa onyeisiala a ga-ahazị n’ụbọchị 12 Eprel “dịka o nwechara ntụgharịuche nakwa iji zaa ọtụtụ oku arịrịọ ndị mmadụ na-akpọ ya”.
Oge ọ na-agwa ndị na-akwado ya okwu n’isi obodo Gabọn bụ Libreville, o kwuputara njikere ọ dị ịgbanwe ọnọdụ mba ahụ.
Nkwuputa ahụ na-abịa dịka ndị mmadụ nọọrọ kemgbe ọnwa ole na ole na-ebugharị akụkọ gbasara mmasị nwaamadị ahụ nwere ịzọ ọkwa onyeisiala.
Leave a Reply