Ndị ọchịchị Democratic Republic of Kongo ekwuola na ọ bụ ha na ndị otu nnupụisi M23 weghaara ọtụtụ obodo na ọwụwa anyawụ nke mba ahụ n’ọnwa na-adịbeghị anya, ga-enwe mkparịtaụka, agbanyeghị na mba ofesi na-etinye ọnụ n’okwu ahụ.
N’ime izu gara aga, ndị ọchịchị mba UK manyere ọnụ n’okwu akpụ n’ọnụ nke na-akpọ oku ka enwe mkparịtaụka gụnyere onye ọ bụla maka iji chọta ihe ngwọta ndọrọ ndọrọ ọchịchị maka esemokwu ahụ.
Mana Praịm Mịnịsta DR Kongo bụ Judith Suminwa Tuluka gwara ndi ntaakuko na ọchịchị ya chọrọ ka ha na ndị agbataobi ha bụ Rwanda, ndị e kwuru na ọ bụ ha na-akwado ndị nnupụisi M23, nwee kparịtaụka.
Dịka ndị ọchịchị Kongo siri kwuo, ihe ruru mmadụ puku asatọ na narị ise anwụọla kemgbe agha ahụ baara ọkụ n’ọnwa Jenụwarị.
A chụpụkwala ọtụtụ narị puku mmadụ n’ụlọ ha kemgbe ọgbaaghara ahụ malitere, bụ nke ndị ụlọọrụ UN na ndị ọzọ kwuru na Rwanda nwere aka na ya.
O kwuru na nke bụ eziokwu bụ na ọ bụ mba Rwanda na-ebuso iguzosi ike nke okeala na ọchịchị nwere onwe nke DR Kongo agha na mpaghara ahụ.
Leave a Reply