Take a fresh look at your lifestyle.

Ndị uweojii anwụchiela nwaagbọghọ a sị na-ere ụmụaka n’Imo steeti

0 281

Ụlọọrụ ndị uweojii n’Imo steeti anwụchiela onye a na-enyo enyo na ọ bụ onye na-atọ ma na-erekwa ụmụaka.

Nwaagbọghọ ahụ gbara afọ iri anọ (40) aha ya bụ Onyinyechi Emeka bụ nwaafọ Umuokwu Mbutu dị n’Okpuru ọchịchị Isiala Ngwa South n’Abịa steeti.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n’Imo steeti bụ Henry Okoye kwupụtara nke a n’ozi ọ wepụtara n’ụbọchị Mọnde 10 Febụwarị 2025.

Okoye sịrị na ndị uweojii nwụchiri nwaada ahụ n’Okigwe oge ọ kpọ nwata gbara afọ ise o zuru n’ohi na-aga Ebonyi steeti.

“Na mbụ, nwaagbọghọ ahụ kwuru na ya bụ nwata nwoke bụ nwa nwanne ya nwaanyị mana anyị malitere inyo ya enyo oge o bidoro na-atagheri ọnụ,” ka Okoye kwuru.

Ọ sịrị na nwata ahụ nyere ha akara ekwentị nna ya bụ nke mere e ji chọpụta na ọ bụ nwata na-efu efu n’Abịa steeti.

Ozi ahụ kwuru na nnyocha ndị uweojii chọpụtara na a kwụrụ ya bụ nwaagbọghọ puku naịra iri atọ (30,000) iji kpọgaa nwata ahụ na nke onye chọrọ ịzụ ya n’Ebonyi steeti.

Ka o sinadị, e nyefeela okwu ahụ n’aka ngalaba ndị uweojii na-ahụ maka ndị omekome maka ime nnyocha miri emi nakwa inwụchi ndị nke ọzọ aka ha dị n’arụ ahụ.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *