Otu ọrụ nchekwa ‘Nigeria Security and Civil Defence Corps'(NSCDC) n’ Abia Steeti anwụchiela mmadụ atọ a na-enyo maka izu mmanụ agbịdị Umuowaga Umuelechi Obuzo Asa dị n’Okpuru Ọchịchị Ukwa West n’Abịa Steeti.
Ndị aka kpaara gụnyere otu nwoke a kpọrọ Oscar Eteobong gbara afọ iri ato na asaa,onye Okpuru Ọchịchị Abak , Issac Aniete Edemba Udoh gbara afọ iri ano, onye Okpuru Ọchịchị Obot Akara dị n’n Akwa Ibom Steeti nakwa Emmanuel Uzoma Sunday (M) gbara afọ iri abuo, onye Isiala-Ngwa North dị n’ Abia Steeti. team.
Ngalaba ụlọọrụ ahụ na-ebu agha mmegide ohi mmanụ agbịdị kwuru na ọ bụ ama gbaara ha mere ha jiri maa imi n’ala ma chọpụta mmanụ agbịdị ha zur n’ebe ọ dị ukwuu.
Onyeisi NSCDC ngalaba nke Abia Steeti bụ Akinsola Aderemi kwuru na ha na-eme nnyocha ịmata ndị ọzọ aka ha dị na mpụ itinyere Naijiria aja na garị.
Leave a Reply