Take a fresh look at your lifestyle.

NFF na-akwado ịkpọghachita otu Super Eagle site na mba Libya

0 493

Otu na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa bụ Nigeria Football Federation (NFF) akatọọla ma kagbuo ajọ ọnọdụ mba Libya tinyere otu egwu bọọlụ Super Eagles nke Naịjirịa n’ọdọ ụgbọelu Al-Abraq Airport dịka ha bịara maka asọmpi ntozu n’asọmpi ịkọ mba Afrịka.

Cheta na ndị isi mba Libya nyere iwu ka a kpọchie otu egwu bọọlụ Super Eagles n’ọdọ ụgbọelu ahụ ihe ruru awa iri na abụọ.

NFF kwuru na agwa ahụ bụ nke jubguru onwe ya.

Akụkụ anyị nwetara n’aka ngalaba NFF na-ahụ maka mgbasa ozi kwuru na ọ bụ n’ọdọ ụgbọelu Benghazi Airport ka ụgbọelu otu Super Eagles kwesịrị ịda na ya mana ha amaghị ihe mere e ji ziga ụgbọelu ahụ n’ọdọ ụgbọelu Al-Abraq nke akụkọ kwuru na ọ bụ naanị ndị na-eje ala nsọ na-eji ọdọ ụgbọelu Al-Abraq eme njem maka na o perempe.

NFF kwuru na nke metutara atụmatụ na mbọ ha gbara iji buru otu egwu Super Eagles ma buga ha n’ụlọ oriri na ọṅụṅụ ha kwesịrị ị nọ na ya.

Ka ọ dị ugbua, ndi otu egwu bọọlụ Super Eagles nke onyeisi ha bụ William Troost Ekong ekwuola na ha agaghị asọ mpi ahụ n’ihi ajọ ọnọdụ mba Libya tinyere ha na ya. Ekong gara n’ihu gosi foto ajọ ọnọdụ ha ọ n’ime ya n’ọdọ ụgbọelu ahụ.

Otu NFF ekwuola na ha amalitela atụmatụ ibughchita otu bọọlụ Super Eagles na Naịjirịa.

N’aka nke ọzọ mịnịsta na-ahụ maka egwuregwu na Naịjirịa bụ John Owan Enoh akagbuola ajọ omume mba Libya mezsoro otu egwu bọọlụ Super Eagles.

John Owan Enoh katọrọ ajọ omume ndị isi egwuregwu na mba Libya ma kpọọ oku ka ha rube isi nye iwu na-akwado egwuregwu bọọlụ na mbaụwa niile gbaa gburugburu.

O kwuru na mịnịstri ya na-agba mbọ iji hụ na ha kpọpụrụ otu Super Eagles n’ọdọ ụgbọelu Al-Abraq ebe ha nọgoro karịa awa iri na abuo na ụma.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *