Take a fresh look at your lifestyle.

Pope Francis etinyela ọnụ gbasara ndịagha United Nations e merụrụ ahụ na Lebanon

0 378

Onyeisi ụka Katọlịc bụ Popu Francis enyela ndụmọdụ gbasara ọnọdụ ndịagha United Nations (UN) bụ ndị mmadụ ise n’ime ha merụrụ ahụ na Lebanọn.

Popu Francis bụ onye kpọrọ oku ahụ na Vatican kwuru “ana m agwa ndị niile ọ gbasara dịka Palestine, Izrel na Lebanọn ka ha kwanyere ndịagha UN ugwu”.

“Na mbụ, akpọọla m oku ka ha kwụsị agha dị n’etiti ha ma sonyere ụzọ iji ọnụokwu na ịkpa ntata were chọọ udo”.

Mana ndị Hezbollah na-ekwu na ha na ndị Izrel ka na-akwakọrịta mgbọ na mpaghara obodo ha dị n’okeala ha na ndị Izrel.

Ndị Izrel n’aka nke ọzọ na-ekwu na ọtụtụ ndịagha merụrụ ahụ ma nọrọ n’ụlọọgwu ugbua.

Praịm Minista Lebanọn bụ Najib Mikati katọrọ oku ogbo ya bụ Praịm Minista Izrel bụ Benjamin Netanyahu kpọrọ ka e wepụ ndịagha UN nọ ọrụ nchekwa n’okeala mba ahụ.

Netanyahu kpọrọ oku ahụ n’ụtụtụ ụbọchị Sonde ma kwuo ka ndịagha UN si n’okeala ahụ ha nọ ọrụ pụọ ozugbo ozugbo.

Mana Mikatị kọwara na nke ahụ bụ “ụzọ ndị iro ha ji na-enupụisi n’iwu mbaụwa”.

Ka agha dị n’etiti Izrel na Lebanọn na-aga n’ihu, ọtụtụ ndịagha bịara ọrụnchekwa maka udo nakwa ndịọrụ gbatagbata enwetela nnukwu mmerụahụ bụ nke mba ọnụọgụ ha ruru iri na anọ katọrọ.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *