Take a fresh look at your lifestyle.

Ụlọomeiwu mba Kenya amalitela okwu ịchụpụ Osote Onyeisiala Rigathi Gachagua

0 497

Osote onyeisiala mba Kenya bụ Rigathi Gachagua ga-awụchi n’ụlọomeiwu mba Kenya taa maka ịzara ọnụ ya n’ebubo nrụrụaka nke mere ka ụlọomeiwu malite mkparịtaụka ịchụpụ ya n’ọkwa.

Ebubo e boro Rigathi Gachagua gunyere ichere Onyeisiala William Ruto aka mgba nakwa ịkwado ndị mere ngagharịiwe na ndị na-achọ nkewa obodo.

A na-ebo Gachagua ebubo na ọ na-eji ụlọọrụ iri abuo o nwere jiri ezuru ego obodo.

N’ozi o wepụtara n’abalị Mọnde abali asaa nke onwa Ọktoba, Rigathi Gachagua gọnarịrị ebubo ndị ahụ nke ọ kọwara dịka nkata ndị na-agba ya mgba na-akpa iji chụpụ ya n’ọkwa.

Rigathi Gachagua gara n’ihu kwusie ike na ọ ga azara ọnụ ya megide ebubo ndị ahụ e boro ya.

 

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *