Take a fresh look at your lifestyle.

Onyeisiala agwala ndị uweojii ka ha chekwaa isi ụlọọrụ okpuru ọchịchị na Riva steeti

0 172

Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Ahmed Tinubu enyela iwu ka ndị uweojii chekwaa isi ụlọọrụ okpuru ọchịchị niile dị na Riva steeti iji gbochie mwakpo n’ụdị ọbụla.

Ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala bụ Bayo Onanuga kwuputara nke a n’akwụkwọ ozi o wepụtara banyere mwakpo ndị a na-amaghị wakporo ọtụtụ isi ụlọọrụ okpuru ọchịchị dị na steeti ahụ ụbọchị Mọnde abali asaa nke onwa Ọktoba, 2024.

Onyeisiala Tinubu gwara ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị nọ na steeti ahụ ka ha sepụ aka ma nye udo ohere na steeti ahụ.

Cheta na ọgbaghara bidoro na Riva steeti dịka Gọvanọ Siminalayi Fubara duru ndị isioche okpuru ọchịchị ọhụrụ turu ugo na ntụliaka okpuru ọchịchị e mere na steeti ahụ ụbọchị Satọde abali ise Ọktoba.

Ndị ekperima agaala mụnye ọkụ n’ụfọdụ isi ụlọorụ Okpuru ọchịchị Rivas steeti ma chụpụ ndị isioche ọhụrụ e dụrụ n’iyi ọrụ.

Akụkọ kwuru na Okpuru ọchịchị ndị amụnyere isi ụlọọrụ ha ọkụ gụnyere Ikwerre, Eleme, Obio/Akpor na Emohua.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *