Take a fresh look at your lifestyle.

Kedụ ndị tozuru ịnata ego N75,000 gọọmentị chọrọ inye ndị mmadụ?

0 544

Gọomentị Naịjirịa ewepụtala usoro ga-etozu ndị mmadụ isonye na ndị ga-erite ego ruru N75,000 gọomentị etiti chọrọ inye ezinaụlọ ụmụ Naịjirịa ruru mmadụ N15nde maka ọtanisi na-eme n’obodo.

Ha na-eme nke a n’atụmatụ a kpọrọ ‘Social investment Programme’.

Onyeisiala Tinubu kwuru na ya ahazichala ihe iji malitegharịkwa inye ego ahụ a na-esite n’ụlọakụ eke ndị kachasị nọrọ n’ụbịa na Naịjirịa dịka ndị Naịjirịa na-eti mkpu na ihe esika.

Tupu ha akwụsị ike ego ahụ n’ọnwa ole na ole gara aga, ụmụ Naịjirịa ruru nde atọ na-anatabu ego ahụ mana dịka ego nri malitere na-arị elu, gọọmentị kwuru na ha ga-etinyekwu ọnụọgụgụ ndị na-enweta ya ka ha ruo mmadụ nde iri na ise.

Mịnịsịta na-ahụ maka ego na akụnaụba obodo bụ Wale Edun kwuru na ndị ga-anata ego ahụ ga-enweriri ihe ndị:

  1. National Identity Number (NIN): Nke a bụ akara njirimara onye ọbụla na Naịjirịa
  2. Biometric Verification Number (BVN): Nke a bụ akara azụmahịa onye ọbụla bụ nke a na-eny n’ụlọakụ.
  3. Ekwenti: Onye ọbụla ga-esonye n’atụmatụ a ga-enweriri ekwenti.

O kwuru na nke a bụ iji hụ na ego ahụ na-eru ndị o kwesiri iru na-enweghi nrụrụaka ọbụla dị na ya.

Edun kwuru na ha ga-enye ndị mmadụ ihe ruru puku N75,000 n’ọnwa atọ nke ga-apụta na ha ga-enweta N25,000 kwa ọnwa ruo ọnwa atọ.

N’okwu ya; ” Nke ahụ ga-abụ N25,ooo kwa ọnwa nye ezinaụlọ nde iri na ise nwere ihe ruru mmadụ ise n’ime ya.

Nke a ga-eme na a ga-azụ mmadụ nde iri asaa na ise”.

Ọzọ dịka ibe ya bụ, mịnịsịta ahụ kọwara na gọọmentị chọkwara inye ndị ọrụaka, ndị ntoroọbịa, ndị na-azụ ahịa, ụmụnwaanyị na ndị na-azụ obere ahịa puke naịra ise ha agaghị akwụghachi akwughachi.

Mana na nke a, a ga-eji igwe dijitaal nyocha ndị mmadụ ga-eru mmadị 1000 n’ime ọkpụrụ ọchịchị 774 niile dị na Naịjirịa nke a ga-abụ ego ruru ijeri naịra 50 ọzọkwa iji nyere ndị mmadụ aka.

Maazi Edun kwuru na nke a bụ ụzọ dị laarị iji nyere ndị mmadụ aka ugbua.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *