Gọomentị Naịjirịa ewepụtala usoro ga-etozu ndị mmadụ isonye na ndị ga-erite ego ruru N75,000 gọomentị etiti chọrọ inye ezinaụlọ ụmụ Naịjirịa ruru mmadụ N15nde maka ọtanisi na-eme n’obodo.
Ha na-eme nke a n’atụmatụ a kpọrọ ‘Social investment Programme’.
Onyeisiala Tinubu kwuru na ya ahazichala ihe iji malitegharịkwa inye ego ahụ a na-esite n’ụlọakụ eke ndị kachasị nọrọ n’ụbịa na Naịjirịa dịka ndị Naịjirịa na-eti mkpu na ihe esika.
Tupu ha akwụsị ike ego ahụ n’ọnwa ole na ole gara aga, ụmụ Naịjirịa ruru nde atọ na-anatabu ego ahụ mana dịka ego nri malitere na-arị elu, gọọmentị kwuru na ha ga-etinyekwu ọnụọgụgụ ndị na-enweta ya ka ha ruo mmadụ nde iri na ise.
Mịnịsịta na-ahụ maka ego na akụnaụba obodo bụ Wale Edun kwuru na ndị ga-anata ego ahụ ga-enweriri ihe ndị:
- National Identity Number (NIN): Nke a bụ akara njirimara onye ọbụla na Naịjirịa
- Biometric Verification Number (BVN): Nke a bụ akara azụmahịa onye ọbụla bụ nke a na-eny n’ụlọakụ.
- Ekwenti: Onye ọbụla ga-esonye n’atụmatụ a ga-enweriri ekwenti.
O kwuru na nke a bụ iji hụ na ego ahụ na-eru ndị o kwesiri iru na-enweghi nrụrụaka ọbụla dị na ya.
Edun kwuru na ha ga-enye ndị mmadụ ihe ruru puku N75,000 n’ọnwa atọ nke ga-apụta na ha ga-enweta N25,000 kwa ọnwa ruo ọnwa atọ.
N’okwu ya; ” Nke ahụ ga-abụ N25,ooo kwa ọnwa nye ezinaụlọ nde iri na ise nwere ihe ruru mmadụ ise n’ime ya.
Nke a ga-eme na a ga-azụ mmadụ nde iri asaa na ise”.
Ọzọ dịka ibe ya bụ, mịnịsịta ahụ kọwara na gọọmentị chọkwara inye ndị ọrụaka, ndị ntoroọbịa, ndị na-azụ ahịa, ụmụnwaanyị na ndị na-azụ obere ahịa puke naịra ise ha agaghị akwụghachi akwughachi.
Mana na nke a, a ga-eji igwe dijitaal nyocha ndị mmadụ ga-eru mmadị 1000 n’ime ọkpụrụ ọchịchị 774 niile dị na Naịjirịa nke a ga-abụ ego ruru ijeri naịra 50 ọzọkwa iji nyere ndị mmadụ aka.
Maazi Edun kwuru na nke a bụ ụzọ dị laarị iji nyere ndị mmadụ aka ugbua.
Leave a Reply