Take a fresh look at your lifestyle.

Onyeisiala Tinubu Eguzobela Kọmitii Ga-Edozigharị Ụlọ Mmepụta Igwe Ajaokuta

Temitope Mustapha dere ya na bekee

0 298

Onyeisiala Naijiria bụ Bola Ahmed Tinubu, akwadola ka e hiwe kọmitii ndị minista mmadụ ise n’ime gọọmentị ya ka ha malite ịrụgharị ụlọ ọrụ mmepụta igwe dị n’Ajaokuta n’usoro n’usoro.

Mịnịsta na-ahụ maka mmepe igwe, Shuaibu Audu mere ka a mara nke a ka ọ na-agwa ndị nta akụkọ okwu oge ha mechara nzukọ ime ụlọ na Presidential Villa na Tọọzde n’Abuja.

Ndị otu kọmitii ahụ gụnyere Mịnịsta na-ahụ maka ego na mịnịsta na-ahụ maka akụ na ụba, Wale Edun, Mịnịsta na-ahụ maka mmepụta ihe, ahia na itinye ego, Doris Uzoka, Minista nke Solid Minerals Development, Dele Alake, Minista nchekwa, Muhammadu Badaru na Minista. nke Steel Development, Shuaibu Audu.

Audu kwuru na ọ bụrụ na kọmitii ahụ nwere ike rụchaa ọrụ niile e debere n’aka ya, nke gụnyere ịmalitegharị ọrụ igwe Ajaokuta, ọchịchị Onyeisiala Tinubu ga-enwe ike ịmepụta ọrụ karịrị narị puku ise.

N’ikwu okwu n’ọrụ cheere kọmitii ahụ n’ihu, Minista ahụ gosipụtara na mmadụ abụọ so na kọmitii ahụ, Minista Nchebe na ya onwe ya zutere Lu’an Steel Company, otu n’ime ụlọ ọrụ iri abụọ kachasị elu na China nke na-emepụta ihe dị ka nde igwe 20 metric ton kwa afọ, ma kwenye ka e guzobe ụlọ ọrụ igwe ọhụrụ na Naijiria.

Dị ka ihe na-esochi nkwekọrịta ahụ, ụlọ ọrụ na-ahụ maka nchara enyela nkwa ya ibuga otu ndị dị elu na Naijiria ka afọ ọhụrụ China gachara na njedebe nke Febrụwarị 2024.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *