Ọkamara Ali Pate, na-ekwu na Gọọmenti etiti ga-ebunye ijeri naira 50 na ụlọ ọrụ ahụike(PHC)
Chigo dere ya n'Igbo.
Mịnịsta na-ahụ maka ahụike na ọdịmma ọha, Ọkamara Ali Pate, na-ekwu na Gọọmenti etiti ga-ebunye ijeri naira 50 na ụlọ ọrụ ahụike Primary Healthcare (PHC) na nkeji mbụ nke 2024.
O mere nkwupụta ahụ na Tọzdee na Abuja n’oge nnọkọ nke ise nke Basic Health Care Provision Fund (BHCPF) na Nzukọ Kọmitii na-ahụ maka Minista.
BHCPF na-eje ozi iji kwado ihe ngwungwu ọrụ ahụike kacha mma (BMPHS) ma kwalite ohere mmefu ego maka ngalaba ahụike.
Dị ka Pate si kwuo, a ga-enyefe ego ndị enwetalarị na BHCPF site na ụlọ ọrụ PHC steeti iji nyefee ụmụ nwanyị na ụmụaka ọrụ.
“Nke ahụ bụ akụkụ nke ebumnuche Onye isi ala Bola Tinubu setịpụrụ maka anyị ka anyị nwee ike ịgbasa ụlọ ọrụ n’ime afọ anọ na-abịa site na 8,000 ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 17,000 PHCs. Ọzọkwa, idebanye aha ndị Naijiria na-adịghị ike ka ha nweta ọrụ nlekọta ahụike dị mma. “
Leave a Reply