Ọ BỤ N’OBI MWUTE KA NDỊ ISI NA NDỊ OTU NUJ (VON CHAPEL) JI NABATA OZI MAKA ỌNWỤ ONYE OTU HA MA BỤRỤKWA ONYE ODEAKỤKỌ NA ZAMFARA STEETI, HAMISU DANJIGBA, SITE N’AKA NDỊ OMEKOME NA-ATỌ MMADỤ. ỌNWỤ YA BỤ IHE NCHETA ỌZỌ DỊ MWUTE MAKA IHE EGWU NKE NA-ECHE NDỊ NAIJIRIA N’IHU N’AGBANYEGHỊ AGBỤLỤ, EKPEMEKPE MA Ọ BỤ OMENALA ONYE N’IHI ENWEGHỊ NCHEKWA N’OBODO.
ANYỊ NA-AKATỌ N’OZUZU OKE IHE ỌJỌỌ NKE A MERENỤ MA NA-EZIGARA EZINỤLỌ YA NKASI OBI N’OGE IHE MWUTE A MERE NA NDỤ HA. ANYỊ NA-AKPỌKUKWA NDỊ ỌRỤ NCHEKWA NKE A METỤTARA KA HA CHỤSOO MA NWUDE NDỊ OMEKOME A MA MEE KA HA ZAA AJỤJỤ MAKA MPỤ HA.
ỌZỌZỊ, ANYỊ NA-ARỊỌ CHINEKE PỤRỤ IME IHE NIILE KA Ọ HAPỤ IKWE KA ỤDỊ IHE ỌJỌỌ DỊ ETU A DAKWASA EZINỤLỌ VON OZỌ
N’IKPEAZU, KA MKPỤRỤ OBI HAMISU DANJIGBA ZURU IKE N’UDO.
ONYE BINYERE AKA N’OZI A
TAIWO GODWIN
ODEAKWỤKWỌ OTU AHỤ
Leave a Reply