Take a fresh look at your lifestyle.

Ntụliaka Na-Adabaghị N’Oge: Peter Obi Ebidola Achụmnta Vootu Nke LP Maka Ọkwa Gọvanọ Na Bayelsa

0 448

Onye zọrọ ọkwa onyeisiala nke Labour Party (LP) na ntuliaka onyeisiala n’abalị iri abụọ na ise nke ọnwa Febụwarị, bụ Maazị Peter Obi, ebidola achụmnta vootu pati ahụ maka ntuliaka gọvanọ na-abịa n’abalị iri na otu nke ọnwa Nọvemba na Bayelsa steeti.

Obi, onye kwuru okwu ya na onyeisi oche mba LP, bụ Maazị Julius Abure, mesiri ndị mmadụ obi ike na onye na-azọ ọkwa gọvanọ pati ahụ bụ Udengs Eradiri ga-emeri na ntuliaka ahụ.

O kwuputara na pati ahụ nwere nnukwu nkwado na steeti ahụ, tinyere ọrụ ya na ọkachamma ya.

Ọ gwara ndị Bayelsa steeti ka ha pụta n’igwe were vootu nye Eradiri ka ọ bụrụ onye ga-achị steeti ahụ, ma kọwaa usoro wepụtara Eradiri dịka onye ga-azọ ọkwa gọvanọ nke pati ahụ dị ka ihe kwesịrị ntụkwasị obi.

“Ihe Naijirịa enweghị bụ nkwenye, nke ahụ bụkwa otu n’ime isi nsogbu ya. Ọ bụrụ na ị maghị ebe ị na-abịa, nke ahụ pụtara na ị maghị ebe ị na-aga.

“Ka m si Port-Harcourt na-abịa Yenagoa, ị ga-ahụ ịda ogbenye. Naijiria dara Bayelsa afọ iri ise na asaa ka achọpụtachara mmanụ.

“Mgbe Sokoto dị ka steeti kacha daa ogbenye, Bayelsa bụ onye na-esote ya. Steeti ahụ tara ahụhụ site na otu n’ime nsogbu idei mmiri kacha njọ n’afọ gara aga, kemgbe akụkọ ihe mere eme nke Naijiria,” Obi kwuru.

Onye isi oche mba ahụ bụ Abure kwuru na obi siri ya ike na ndị Labour Party ga-eguzobe ọchịchị ọzọ na Bayelsa.

O kwuru na otu pati People’s Democratic Party (PDP) na All Progressives Congress (APC) emebiela ụmụ Naijiria na ndị steeti ahụ karịsịa.

“Anyị ga-agbanwe akụkọ akụ na ụba nke steeti Bayelsa. Eradi bụ naanị onye na-azọ ọkwa gọvanọ na Labour Party na Bayelsa steeti.

“LP dabeere na iguzosi ike n’ezi ihe na arụmọrụ. PDP na APC adaala. Anyị agbaala PDP na APC, ha dara.

“Ihe si na ya pụta bụ enweghị nchekwa, ịda ogbenye na mmebi akụrụngwa. Labour Party abịawo ịgbanwe akụkọ. votu maka Udengs Eradiri, votu LP bịa na Nọvemba 11,” o kwuru.

N’ikwu okwu ka enyefechara Eradiri ọkọlọtọ pati ahụ, onye na-azọ ọkwa gọvanọ nke pati ahụ kwere nkwa na ya ga-edozi steeti ahụ, ma ọ bụrụ na o meriri ntuliaka gọvanọ.

O kwuru na mmemme ya bụ ka ndị mmadụ na-akpakọrịta mana ọ bụghị ime mkpọtụ kama ọ ga-agakwuru ndị obodo ime obodo ka ha mara ebumnobi ya.

Eradiri kwuru na ọ bụrụ na a họpụta ya dịka gọvanọ, ọ ga-eme ka ndị mmadụ nwee ndụ ka mma ma kwe nkwa na ha agaghị etinye ndọrọ ndọrọ ọchịchị na mmepe Bayelsa.

Ọ gbakwụnyere na ahụmahụ ya, nke nwetara n’ọkwa dị iche iche e nwetara n’ogbe ndị nta, ọchịchị steeti na mba, etinyela ya n’ọkwá ka ọ dozie nsogbu na steeti ahụ.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *