Take a fresh look at your lifestyle.

Osote Onyeisiala Shettima Erutela Cuba Maka Ọgbakọ G77

Bilkisu Halilu Pai dere ya na bekee

0 417

Osote onye isi ala Naijiria, Kashim Shettima abatala Havana isi obodo Cuba, maka ọgbakọ G77+China.

Ọ ga-anọchi anya Onyeisiala Bola Tinubu na nzụkọ ahụ, nke ekwesịrị ime site na abalị iri na ise ruo abalị iri na asaa ọnwa Septemba, 2023.

Osote Onyeisiala Shettima ga-esonyere ndị isi mba ụwa ndị ọzọ, nke gụnyere odeakwụkwọ ukwu nke United Nations, Antonio Guterres n’ọgbakọ ahụ iji kwurịta okwu mmepe na-eche ndị otu ahụ ihu, nke ka ukwuu site na ndịda ụwa.

Ọgbakọ ahụ ga-enyochakwa ụzọ ndị ọzọ a ga-eji gboo ihe ịma aka na-eche mmepe ihu n’ime mba ndị otu ahụ dị ka itinye aka na sayensị, teknụzụ, na ihe ọhụrụ iji kwalite uto mmekọrịta ọha na eze na akụ na ụba.

Ọzọkwa, osote onye isi ala Shettima ga-eji ohere ọgbakọ ahụ nwee nzukọ ya na ndị ndu ụwa ndị ọzọ iji kwalite azụmahịa na ntinye ego nke Naijiria nke gbadoro ụkwụ na atụmatụ mmepe akụ na ụba nke ọchịchị Onyeisiala Tinubu.

Onye isi ala mba Cuba bụ Miguel Díaz-Canel na-akwado nzukọ Havana na ikike ya dị ka onye isi oche G77 na China.

Isiokwu nke Mgbakọ nke afọ a bụ: “Ihe ịma aka mmepe dị ugbu a: Ọrụ Sayensị, Nkà na ụzụ na mmepụta ọhụrụ.”

Naijiria so na ndị tọrọ ntọala otu G77, nke mba iri asaa na asaa na-emepe emepe hiwere n’afọ 1964.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *