Take a fresh look at your lifestyle.

Gọọmenti Bayelsa Steeti Adịla Njikere Ịchịkọba Asọmpi Mgba Kwa Afọ

Imelda Nwajei dere ya na bekee

0 637

Gọọmenti Bayelsa steeti kwuru na ha adịla njikere ịchịkọba asọmpi mgba kwa afọ, nke akpọrọ Senator Douye Diri National Wrestling Classics, nke ekwesịrị ime site na August 6th – 10th 2023 na Yenagoa, Bayelsa State, Nigeria.

Asọmpi a bidoro n’afọ 2009 na ọ bụ asọmpi kwa afọ nke na-ebute ndị egwuregwu mba si na steeti dị iche iche na mba ahụ. A na-akpọkarị asọmpi a site n’aka gọvanọ nọ n’ọchịchị na steeti Bayelsa. Ihe dị ka steeti iri abụọ na asatọ ga-eso na asọmpi nke afọ a

Onyeisi otu Nigeria Wrestling Federation (NWF), nakwa Kọmishọna steeti Bayelsa na-ahụ maka ndị ntorobịa na mmepe egwuregwu, Daniel Igali, kwuru nke a na mkparịtaụka ya na Voice of Nigeria gbara n’ụlọọrụ ya na Samson Siasia Sports Complex dị na Yenagoa.

Igali kwuru, “Anyị dị njikere nke ukwuu ịnabata asọmpi a.” “Asọmpi a bụ mbipụta nke abụọ na ọchịchị Senator Douye Diri dị ka gọvanọ. A na-akpọkwa asọmpi ahụ dị ka iko gọvanọ.”

“Asọmpi a bụ nhọrọ tupu asọmpi Olympic, ebe a ga-ahọpụta ndị egwuregwu kacha mma n’ụdị ha dị iche iche ga-anọchi anya Naịjirịa n’afọ na-abịa 2024 na Serbia.”

“Gọvanọ Bayelsa steeti, Senator Douye Diri, ekpebiela ịzụlite ndị ntorobịa site na egwuregwu na nke a bụ nke mbụ n’ime ogologo oge ebe anyị hụrụ nlebara anya nke a na Ministri nke ndị ntorobịa na egwuregwu,” Daniel Igali kọwara.

Dịka Kọmishọna steeti Bayelsa na-ahụ maka ndị ntorobịa na egwuregwu, n’afọ 2021, Bayelsa steeti bịara nke atọ na mmemme egwuregwu na Naịjirịa ma steeti ahụ bịakwara nke abụọ na mmemme egwuregwu mba dị na Asaba, Delta steeti.

“Kemgbe mmalite nke asọmpi a, anyị achọpụtala ụdị nkà dị iche iche. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ndị egwuregwu mba niile ka achọpụtara na asọmpi a,” Igali kwuputara ụfọdụ n’ime ihe dị iche iche emere na ozi ahụ.

O gosikwara ndị egwuregwu mba ofesi sitere na USA bụ ndị nọ n’ala maka asọmpi a. Ọzọkwa, Blessing Oborududu na Oduayo Adekoroya, bụ ndị mba Commonwealth na Africa ga-asọmpi.

Igali gara n’ihu nye Gọọmenti etiti ndụmọdụ ka ọ na-eme mmemme maka ndị na-eme egwuregwu oge niile ka Naijiria wee ruo ụkpụrụ mba ụwa.

N’otu aka ahụ, onye isi otu mgba mgba ọdịnala na Naịjirịa bụ Olomo Agbadabina kwuru na isi nsogbu ndị otu a na-eche ihu bụ ego. Ọ gara n’ihu rịọ gọọmentị etiti ka ha kwado ụlọ ọrụ egwuregwu n’ụzọ ziri ezi ka o wee ruo ụkpụrụ mba ụwa.

O kwukwara na ndị nkuzi sitere na steeti dị iche iche na-enye ụmụ akwụkwọ si ụlọ akwụkwọ praịmarị na sekọndịrị ọzụzụ gbasara mgba mgba ọdịnala.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *