Take a fresh look at your lifestyle.

Sit-at-home: Lee etu mpaghaghara ọwụwa anyanwụ dị taa

0 242

Dịka taa bụ ụbọchị Mọnde, ma bụrụkwa ngwụcha ọnwa Julaị, ndị mmadụ na-ele anya ịhụ ihe ga-eme n’ala Igbo.

Cheta na onye ndu otu alaka Ipob bụ Simon Ekpa kpọrọ oku nọrọnụlọ n’ọwụwa anyanwụ site Julaị 31 ruo Ọọgọst 4 nke afọ 2023.

N’aka ọzọ, n’ụbọchị Fraịde Julaị 28, onye ndu otu nnwereonwe Biafra bụ Nnamdi Kanu nyere Ekpa ntuziaka ka ọkwụsị ikpọ oku a.

Lee ihe anyị hụrụ n’ụtụtụ a.

N’Enugu steeti, ọtụtụ ndị mmadụ apụtaghị. Ebe a na-ere mmanụ ụgbọala, ụlọakụ na ebe oriri mechiri emechi.

Ụfọdụ ahịa, dịka ahịa Artisan mepere emepe, ebe ndị mmadụ ji nwayọ nwayọ apụta.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *