Take a fresh look at your lifestyle.

Akụ Na Ụba: Onyeisiala Tinubu Na-Aga N’Ihu Ige Ndụmọdụ

Timothy Choji dere ya na bekee

0 342

Onyeisiala Naijiria, Bola Tinubu anọgidego na-enwe mkparịta ụka ya na ndị ọkachamara ka ha ga-esi nweta akụ na ụba Naijiria n’ụkwụ dị mma.

N’okwu a, Onyeisiala na osote onyeisiala Kashim Shettima nọrọ na mgbede Wenezde zute onyeisi oche nke Sineti, Godswill Akpabio na ụfọdụ Gọvanọ steeti gụnyere ndị Imo, Kwara, Lagos na Ogun.

Onye ndụmọdụ onye isi ala na ọrụ pụrụ iche, nzikọrịta ozi na atụmatụ, Dele Alake, onye kpughere nke a kwuru na nzụkọ ahụ lebakwara anya ka esi mechaa nhazi na nkesa ihe enyemaka iji belata mmetụta nke mwepụ ego enyemaka mmanụ ụgbọala.

Ndị isi ala tụburu ụzọ kesa ọka na fatịlaịza nye ndị ọrụ ugbo dịka akụkụ nke usoro iji kwalite nchekwa nri na mba ahụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *