Take a fresh look at your lifestyle.

Ndị Isi Ọrụ Nchekwa Ọhụrụ: Onyeisiala Tinubu Edegarala Ụlọ Ndị Nnọchiteanya Akwụkwọ.

Gloria Essien dere ya na bekee

0 386

Onyeisiala Naijiria, Bola Ahmed Tinubu edegarala ụlọ ọgbakọ omebe iwu akwụkwọ maka nhọpụta nke ndị isi ọrụ nchekwa ọhụrụ na mba ahụ.

Ọkaokwu nke nzukọ ahu, Honorable Tajudeen Abbas gụpụtara akwụkwọ ozi a n’ala ụlọ nzukọ ahụ.

Akwụkwọ ozi ahụ kwuru na a na-akpọ Ụlọ Ndị Nnọchiteanya ka ha hụ ọnọdụ nchekwa dị ugbu a n’ala anyị nke chọrọ mgbalị siri ike site n’aka ndị omebe iwu na ndị ọchịchị.

O kwuru na ezigara aha ndị isi ọrụ nchekwa na Sineti maka nkwenye ma nwee ike chọọ ka ụlọ ahụ depụta aha ndị ahụ.

Ọ gwara ndị ụlọ ahụ ka ha nye ndị isi ndị agha ọhụrụ a nnabata dị mkpa.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *